< Aịzaya 40 >

1 Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru.
Comfort ye, comfort ye, My people, saith your God.
2 Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.
Speak to the heart of Jerusalem, and call to her, That her warfare hath been completed, That accepted hath been her punishment, That she hath received from the hand of Jehovah Double for all her sins.
3 Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.
A voice is crying — in a wilderness — Prepare ye the way of Jehovah, Make straight in a desert a highway to our God.
4 A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.
Every valley is raised up, And every mountain and hill become low, And the crooked place hath become a plain, And the entangled places a valley.
5 Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”
And revealed hath been the honour of Jehovah, And seen [it] have all flesh together, For the mouth of Jehovah hath spoken.
6 Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
A voice is saying, 'Call,' And he said, 'What do I call?' All flesh [is] grass, and all its goodliness [is] As a flower of the field:
7 Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
Withered hath grass, faded the flower, For the Spirit of Jehovah blew upon it, Surely the people [is] grass;
8 E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”
Withered hath grass, faded the flower, But a word of our God riseth for ever.
9 Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.”
On a high mountain get thee up, O Zion, Proclaiming tidings, Lift up with power thy voice, O Jerusalem, proclaiming tidings, Lift up, fear not, say to cities of Judah, 'Lo, your God.'
10 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
Lo, the Lord Jehovah with strength cometh, And His arm is ruling for Him, Lo, His hire [is] with Him, and His wage before Him.
11 Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
As a shepherd His flock He feedeth, With His arm He gathereth lambs, And in His bosom He carrieth [them]: Suckling ones He leadeth.
12 Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
Who hath measured in the hollow of his hand the waters? And the heavens by a span hath meted out, And comprehended in a measure the dust of the earth, And hath weighed in scales the mountains, And the hills in a balance?
13 Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
Who hath meted out the Spirit of Jehovah, And, [being] His counsellor, doth teach Him!
14 Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?
With whom consulted He, That he causeth Him to understand? And teacheth Him in the path of judgment, And teacheth Him knowledge? And the way of understanding causeth Him to know?
15 Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
Lo, nations as a drop from a bucket, And as small dust of the balance, have been reckoned, Lo, isles as a small thing He taketh up.
16 Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
And Lebanon is not sufficient to burn, Nor its beasts sufficient for a burnt-offering.
17 O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
All the nations [are] as nothing before Him, Less than nothing and emptiness, They have been reckoned to Him.
18 Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
And unto whom do ye liken God, And what likeness do ye compare to Him?
19 Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
The graven image poured out hath a artisan, And a refiner with gold spreadeth it over, And chains of silver he is refining.
20 Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.
He who is poor [by] heave-offerings, A tree not rotten doth choose, A skilful artisan he seeketh for it, To establish a graven image — not moved.
21 Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
Do ye not know — do ye not hear? Hath it not been declared from the first to you? Have ye not understood [From] the foundations of the earth?
22 Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya.
He who is sitting on the circle of the earth, And its inhabitants [are] as grasshoppers, He who is stretching out as a thin thing the heavens, And spreadeth them as a tent to dwell in.
23 Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
He who is making princes become nothing, Judges of earth as emptiness hath made;
24 Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Yea, they have not been planted, Yea, they have not been sown, Yea, not taking root in the earth is their stock, And also He hath blown upon them, and they wither, And a whirlwind as stubble taketh them away.
25 “Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
And unto whom do ye liken Me, And [am] I equal? saith the Holy One.
26 Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
Lift up on high your eyes, And see — who hath prepared these? He who is bringing out by number their host, To all of them by name He calleth, By abundance of strength (And [he is] strong in power) not one is lacking.
27 Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
Why sayest thou, O Jacob? and speakest thou, O Israel? 'My way hath been hid from Jehovah, And from my God my judgment passeth over.'
28 Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Hast thou not known? hast thou not heard? The God of the age — Jehovah, Preparer of the ends of the earth, Is not wearied nor fatigued, There is no searching of His understanding.
29 Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
He is giving power to the weary, And to those not strong He increaseth might.
30 Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
Even youths are wearied and fatigued, And young men utterly stumble,
31 ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
But those expecting Jehovah pass [to] power, They raise up the pinion as eagles, They run and are not fatigued, They go on and do not faint!

< Aịzaya 40 >