< Aịzaya 4 >

1 Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ. Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke. Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị! Anyị ga-akpara onwe anyị nri, zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị, ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”
Na mokolo wana, basi sambo bakokangama na mobali moko mpe bakoloba: « Tokomileisa biso moko mpe tokomilatisa biso moko; yo, ndima kaka ete tobengama na kombo na yo! Longola soni na biso! »
2 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi.
Na mokolo wana, nkona ya Yawe ekokoma kitoko mpe nkembo, bongo mbuma ya mabele ekosala lokumu mpe nkembo, ya ndambo ya bana ya Isalaele oyo babiki.
3 Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem.
Bato oyo bakotikala na Siona mpe ba-oyo bakovanda na Yelusalemi bakobengama basantu: bango nyonso oyo bakombo na bango ekomama kati na bato oyo batikali na bomoi na Yelusalemi.
4 Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ.
Yawe akolongola botutu ya basi ya Siona, akopetola Yelusalemi oyo ekomaki mbindo na bilembo ya makila, na nzela ya molimo ya kosambisa mpe ya moto.
5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.
Boye, Yawe akokela na likolo ya ngomba mobimba ya Siona mpe na likolo ya bato oyo basanganaka kuna: lipata na tango ya moyi, mpe kongenga ya moto na tango ya butu. Bongo na likolo na nyonso, nkembo na Yawe ekozipa bango.
6 Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.
Ekozala lokola ndako ya matiti oyo epesaka pio na tango ya molunge ya moyi makasi, ekimelo mpe ebombamelo na tango ya mopepe makasi mpe na tango ya mvula.

< Aịzaya 4 >