< Aịzaya 38 >

1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
Nthawi imeneyo Mfumu Hezekiya anadwala ndipo anali pafupi kufa. Mneneri Yesaya mwana wa Amozi anapita kukamuona ndipo anati “Yehova akuti: Konza bwino nyumba yako, pakuti ukufa; suchira.”
2 Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,
Hezekiya anatembenuka nayangʼana kukhoma, napemphera kwa Yehova kuti,
3 “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
“Inu Yehova, kumbukirani momwe ndayendera pamaso panu mokhulupirika ndi modzipereka ndipo ndakhala ndikuchita zabwino pamaso panu.” Ndipo Hezekiya analira mosweka mtima.
4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,
Ndipo Yehova analamula Yesaya kuti:
5 “Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.
“Pita kwa Hezekiya ndipo ukamuwuze kuti, ‘Yehova, Mulungu wa kholo lake Davide akuti: Ndamva pemphero lako ndipo misozi yako ndayiona; ndidzakuwonjezera zaka 15 pa moyo wako.
6 Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
Ndipo ndidzakupulumutsa, iwe pamodzi ndi mzindawu mʼdzanja la mfumu ya ku Asiriya, Ine ndidzawuteteza mzindawu.
7 “‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.
“‘Ichi ndi chizindikiro cha Yehova kwa iwe kutsimikiza kuti Yehova adzachita zimene walonjeza:
8 Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
Chithunzithunzi chimene dzuwa likuchititsa pa makwerero a Ahazi ndidzachibweza mʼmbuyo makwerero khumi.’” Ndipo chithunzithunzi chinabwerera mʼmbuyo makwerero khumi.
9 Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
Ndakatulo ya Hezekiya mfumu ya ku Yuda imene analemba atadwala ndi kuchira:
10 Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” (Sheol h7585)
Ine ndinaganiza kuti ndidzapita ku dziko la akufa pamene moyo ukukoma. (Sheol h7585)
11 Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
Ndinaganiza kuti, “Sindidzaonanso Yehova, mʼdziko la anthu amoyo, sindidzaonanso mtundu wa anthu kapena kukhala pamodzi ndi amene amakhala pa dziko lapansi lino.
12 Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
Nyumba yanga yasasuka ndipo yachotsedwa. Ngati tenti ya mʼbusa mwapindapinda moyo wanga, ngati munthu wowomba nsalu; kuyambira usana mpaka usiku mwakhala mukundisiya.
13 Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
Ndinkalira kupempha chithandizo usiku wonse mpaka mmawa; koma Inu Yehova munaphwanya mafupa anga ngati mkango, ndipo mwakhala mukundisiya.
14 Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
Ndinkalira ngati namzeze kapena chumba, ndinkabuwula ngati nkhunda yodandaula. Maso anga anatopa nʼkuyangʼana mlengalenga. Inu Ambuye, ine ndili mʼmavuto bwerani mudzandithandize!”
15 Ma gịnị ka m ga-ekwu? Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a. M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile nʼihi ihe mwute nke obi m.
Koma ine ndinganene chiyani? Yehova wayankhula nane, ndipo Iye ndiye wachita zimenezi. Chifukwa cha kuwawa kwa mtima wanga, ine ndidzayenda modzichepetsa masiku amoyo wanga onse.
16 Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ. Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha. I nyeghachila m ahụ ike, mee ka m dị ndụ.
Ambuye, masiku anga ali mʼmanja mwanu. Mzimu wanga upeza moyo mwa Inu. Munandichiritsa ndi kundikhalitsa ndi moyo.
17 Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.
Ndithudi, ine ndinamva zowawa zotere kuti ndikhale ndi moyo; Inu munandisunga kuti ndisapite ku dzenje la chiwonongeko chifukwa mwakhululukira machimo anga onse.
18 Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. (Sheol h7585)
Pakuti akumanda sangathe kukutamandani, akufa sangayimbe nyimbo yokutamandani. Iwo amene akutsikira ku dzenje sangakukhulupirireni. (Sheol h7585)
19 Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
Amoyo, amoyo okha ndiwo amakutamandani, monga mmene ndikuchitira ine lero lino; abambo amawuza ana awo za kukhulupirika kwanu.
20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Yehova watipulumutsa. Tiyeni tiyimbe ndi zoyimbira za zingwe masiku onse a moyo wathu mʼNyumba ya Yehova.
21 Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
Yesaya anati, “Anthu atenge mʼbulu wankhunyu ndipo apake pa chithupsacho ndipo Hezekiya adzachira.”
22 Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”
Hezekiya nʼkuti atafunsa kuti, “Kodi chizindikiro chako nʼchiyani chotsimikiza kuti ndidzapita ku Nyumba ya Yehova?”

< Aịzaya 38 >