< Aịzaya 37 >
1 Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
It came about that when King Hezekiah heard their report, he tore his clothes, covered himself with sackcloth, and went into the house of Yahweh.
2 O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
He sent Eliakim, who was over the household, and Shebna the scribe, and the elders of the priests, all covered with sackcloth, to Isaiah son of Amoz, the prophet.
3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
They said to him, “Hezekiah says, 'This day is a day of distress, rebuke, and disgrace, like when a child is ready to be born, but the mother has no strength to give birth to her child.
4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
It may be Yahweh your God will hear the words of the chief commander, whom the king of Assyria his master has sent to defy the living God, and will rebuke the words which Yahweh your God has heard. Now lift up your prayer for the remnant that is still here.'”
5 Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
So the servants of King Hezekiah came to Isaiah,
6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
and Isaiah said to them, “Say to your master: 'Yahweh says, “Do not be afraid of the words that you have heard, with which the servants of the king of Assyria have insulted me.
7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’”
Look, I will put a spirit in him, and he will hear a certain report and go back to his own land. I will cause him to fall by the sword in his own land.”'”
8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
Then the chief commander returned and found the king of Assyria fighting against Libnah, for he had heard that the king had gone away from Lachish.
9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
Then Sennacherib heard that Tirhakah king of Cush and Egypt had mobilized to fight against him, so he sent messengers again to Hezekiah with a message:
10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
“Say to Hezekiah, king of Judah, 'Do not let your God in whom you trust deceive you, saying, “Jerusalem will not be given into the hand of the king of Assyria.”
11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
See, you have heard what the kings of Assyria have done to all lands by destroying them completely. So will you be rescued?
12 Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?
Have the gods of the nations rescued them, the nations that my fathers destroyed: Gozan, Haran, Rezeph, and the people of Eden in Tel Assar?
13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
Where is the king of Hamath, the king of Arpad, the king of the cities of Sepharvaim, of Hena, and Ivvah?'”
14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
Hezekiah received this letter from hand of the messengers and read it. Then he went up to the house of Yahweh and spread it before him.
15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị:
Hezekiah prayed to Yahweh:
16 “O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
“Yahweh of hosts, God of Israel, you who sit above the cherubim, you are God alone over all the kingdoms of the earth. You made the heavens and the earth.
17 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
Turn your ear, Yahweh, and listen. Open your eyes, Yahweh, and see, and hear the words of Sennacherib, which he has sent to mock the living God.
18 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,
It is true, Yahweh, the kings of Assyria have destroyed all the nations and their lands.
19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
They have put their gods into the fire, for they were not gods but the work of men's hands, just wood and stone. So the Assyrians have destroyed them.
20 Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”
So now, Yahweh our God, save us from his power, so that all the kingdoms of the earth may know that you are Yahweh alone.”
21 Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,
Then Isaiah son of Amoz sent a message to Hezekiah, saying, “Yahweh, the God of Israel says, 'Because you have prayed to me concerning Sennacherib king of Assyria,
22 nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.
this is the word that Yahweh has spoken about him: “The virgin daughter of Zion despises you and laughs you to scorn; the daughter of Jerusalem shakes her head at you.
23 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
Whom have you defied and insulted? Against whom have you exalted your voice and lifted up your eyes in pride? Against the Holy One of Israel.
24 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
By your servants you have defied the Lord and have said, 'With the multitude of my chariots I have gone up to the heights of the mountains, to the highest elevations of Lebanon. I will cut down its tall cedars and choice cypress trees there, and I will enter into its farthest high places, its most fruitful forest.
25 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’
I have dug wells and drunk water; I dried up all the rivers of Egypt under the soles of my feet.'
26 “Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya, ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
Have you not heard how I determined it long ago and worked it out in ancient times? Now I am bringing it to pass. You are here to reduce impregnable cities into heaps of ruins.
27 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere, bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi, na ome na-epupụta epupụta, nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
Their inhabitants, of little strength, are shattered and ashamed. They are plants in the field, green grass, the grass on the roof or in the field, before the east wind.
28 “Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.
But I know your sitting down, your going out, your coming in, and your raging against me.
29 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị, werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị, mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.
Because of your raging against me, and because your arrogance has reached my ears, I will put my hook in your nose, and my bit in your mouth; I will turn you back the way you came.”
30 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
This will be the sign for you: This year you will eat what grows wild, and in the second year what grows from that. But in the third year you must plant and harvest, plant vineyards and eat their fruit.
31 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
The remnant of the house of Judah that survives will again take root and bear fruit.
32 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a.
For from Jerusalem a remnant will come out; from Mount Zion survivors will come. The zeal of Yahweh of hosts will do this.'”
33 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa. “Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
Therefore Yahweh says this about the king of Assyria: “He will not come into this city and he will not shoot an arrow here. He will not come before it with shield or build up a siege ramp against it.
34 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
The way by which he came will be the same way he will leave; he will not enter this city—this is Yahweh's declaration.
35 “Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.”
For I will defend this city and rescue it, for my own sake and for David my servant's sake.”
36 Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
Then the angel of Yahweh went out and attacked the camp of the Assyrians, putting to death 185,000 soldiers. When the men arose early in the morning, dead bodies lay everywhere.
37 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
So Sennacherib king of Assyria left Israel and went home and stayed in Nineveh.
38 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Later, as he was worshiping in the house of Nisrok his god, his sons Adrammelek and Sharezer killed him with the sword. Then they escaped into the land of Ararat. Then Esarhaddon his son reigned in his place.