< Aịzaya 34 >
1 Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.
Sondelani, zizwe, ukuze lizwe; lani bantu, lilalele; umhlaba kawuzwe, lokugcwala kwawo; ilizwe, lakho konke okuvela kilo.
2 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
Ngoba intukuthelo yeNkosi iphezu kwazo zonke izizwe, lolaka phezu kwawo wonke amabutho azo; izitshabalalisile, izinikele ekubulaweni.
3 Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
Ababuleweyo bazo labo bazaphoselwa phandle, levumba labo lizakwenyuka ezidunjini zabo, lezintaba zizancibilika ngegazi labo.
4 Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
Lalo lonke ibutho lamazulu lizabola; lamazulu agoqwe njengomqulu; lalo lonke ibutho labo liwele phansi, njengehlamvu liwohloka evinini, lanjengomkhiwa owohlokayo esihlahleni somkhiwa.
5 Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.
Ngoba inkemba yami izacwila emazulwini; khangela, izakwehlela phezu kukaEdoma laphezu kwabantu bokutshabalalisa kwami ngesigwebo.
6 Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
Inkemba yeNkosi igcwele igazi, inoniswe ngamafutha, ngegazi lamawundlu lelezimbuzi, ngamahwahwa ezinso zezinqama; ngoba iNkosi ilomhlatshelo eBhozira, lokubulala okukhulu elizweni leEdoma.
7 Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.
Lezinyathi zizakwehla kanye lazo, lamajongosi kanye lezinkunzi. Njalo ilizwe labo lizacwila egazini, lothuli lwabo lunoniswe ngamahwahwa.
8 Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
Ngoba kulusuku lwempindiselo yeNkosi, umnyaka wokubuyiselwa kwempikisano yeZiyoni.
9 Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
Lezifula zabo zizaphendulwa zibe yingcino, lothuli lwabo lube yisibabule; lelizwe labo lizakuba yingcino etshayo.
10 Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
Kaliyikucitshwa ubusuku lemini; intuthu yalo izakwenyuka laphakade; kusukela esizukulwaneni kusiya kusizukulwana lizakuba yinkangala; kakho ozadabula phakathi kwalo kuze kube nini lanini.
11 Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
Kodwa iwunkwe lenhloni kuzakudla ilifa lalo; isikhova laso lewabayi kuzahlala kulo. Njalo izakwelula phezu kwalo intambo yencithakalo, lamatshe onxiwa.
12 Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
Bazabizela izikhulu zalo embusweni, kodwa kakho ozakuba khona, leziphathamandla zalo zonke zizakuba yinto engelutho.
13 Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị.
Lameva azakhula ezigodlweni zalo, imbabazane lokhula oluhlabayo ezinqabeni zalo; njalo libe yindawo yokuhlala yemigobho, umuzi wamadodakazi ezintshe.
14 Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.
Izilo zenkangala lazo zizahlangana lezilo ezihlaba umkhulungwane, legogo lizakhalela umngane walo; lesikhova esikhalayo sizaphumula khona, sizitholele indawo yokuphumula.
15 Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.
Lapho isikhova esikhulu sizakwakha isidleke, sibekele, sichamisele, sifukamele ngaphansi komthunzi waso; amanqe lawo azabuthana lapho, yilelo lalelo lomngane walo.
16 Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.
Dingani egwalweni lweNkosi, lifunde; kakukho lokukodwa kwalokhu okuzasilela, kakukho okuzaswela umngane wakho; ngoba umlomo wami ngokwawo ulayile, lomoya wayo ngokwawo ukubuthanisile.
17 Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Ngoba yona ibenzele inkatho yokuphosa, lesandla sayo sibehlukanisele ngentambo; lizakuba yilifa labo kuze kube phakade, kusukela kusizukulwana kuze kube sesizukulwaneni bazahlala kulo.