< Aịzaya 33 >

1 Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị.
Woe to thee who destroys, and thou were not destroyed, and deal treacherously, and they did not deal treacherously with thee! When thou have ceased to destroy, thou shall be destroyed, and when thou have made an end of dealing treacherously, they shall deal treacherously with thee.
2 Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
O Jehovah, be gracious to us, we have waited for thee. Be thou our arm every morning, also our salvation in the time of trouble.
3 Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.
At the noise of the tumult the peoples have fled. At the lifting up of thyself the nations are scattered.
4 Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
And your spoil shall be gathered as the caterpillar gathers. As locusts leap, men shall leap upon it.
5 Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.
Jehovah is exalted, for he dwells on high. He has filled Zion with justice and righteousness.
6 Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.
And there shall be stability in thy times, abundance of salvation, wisdom, and knowledge. The fear of Jehovah is thy treasure.
7 Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.
Behold, their valiant ones cry outside. The ambassadors of peace weep bitterly.
8 Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.
The highways lie waste. The wayfaring man ceases. The enemy has broken the covenant. He has despised the cities. He does not regard man.
9 Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
The land mourns and languishes. Lebanon is confounded and withers away. Sharon is like a desert, and Bashan and Carmel shake off their leaves.
10 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu; ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
Now I will arise, says Jehovah. Now I will lift up myself. Now I will be exalted.
11 Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
Ye shall conceive chaff. Ye shall bring forth stubble. Your breath is a fire that shall devour you.
12 Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
And the peoples shall be as the burnings of lime, as thorns cut down that are burned in the fire.
13 Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
Hear, ye who are far off, what I have done, and ye who are near, acknowledge my might.
14 Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
The sinners in Zion are afraid. Trembling has seized the profane. Who among us can dwell with the devouring fire? Who among us can dwell with everlasting burnings?
15 Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
He who walks righteously, and speaks uprightly. He who despises the gain of oppressions, who shakes away his hands from taking a bribe, who stops his ears from hearing of blood, and shuts his eyes from looking upon evil.
16 Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
He shall dwell on high. His place of defense shall be the munitions of rocks. His bread shall be given. His waters shall be sure.
17 Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
Thine eyes shall see the king in his beauty. They shall behold a land that reaches afar.
18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
Thy heart shall muse on the terror. Where is he who counted? Where is he who weighed the tribute? Where is he who counted the towers?
19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
Thou shall not see the fierce people, a people of a deep speech that thou cannot comprehend, of a strange tongue that thou cannot understand.
20 Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
Look upon Zion, the city of our solemnities. Thine eyes shall see Jerusalem a quiet habitation, a tent that shall not be removed. The stakes of which shall never be plucked up, nor shall any of the cords of it be broken.
21 Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
But Jehovah will be with us there in majesty. A place of broad rivers and streams, in which shall go no galley with oars, nor shall a gallant ship pass thereby.
22 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
For Jehovah is our judge. Jehovah is our lawgiver. Jehovah is our king, he will save us.
23 A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.
Thy tacklings are loosed. They could not strengthen the foot of their mast. They could not spread the sail. Then the prey of a great spoil was divided. The lame took the prey.
24 Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,” nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.
And the inhabitant shall not say, I am sick. The people who dwell in it shall be forgiven their iniquity.

< Aịzaya 33 >