< Aịzaya 32 >

1 Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi.
הן לצדק ימלך מלך ולשרים למשפט ישרו
2 Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.
והיה איש כמחבא רוח וסתר זרם כפלגי מים בציון כצל סלע כבד בארץ עיפה
3 Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.
ולא תשעינה עיני ראים ואזני שמעים תקשבנה
4 Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.
ולבב נמהרים יבין לדעת ולשון עלגים תמהר לדבר צחות
5 Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.
לא יקרא עוד לנבל נדיב ולכילי לא יאמר שוע
6 Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.
כי נבל נבלה ידבר ולבו יעשה און--לעשות חנף ולדבר אל יהוה תועה להריק נפש רעב ומשקה צמא יחסיר
7 Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ, ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile, iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi, ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi.
וכלי כליו רעים הוא זמות יעץ לחבל ענוים (עניים) באמרי שקר ובדבר אביון משפט
8 Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma, ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe.
ונדיב נדיבות יעץ והוא על נדיבות יקום
9 Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.
נשים שאננות--קמנה שמענה קולי בנות בטחות--האזנה אמרתי
10 Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị, unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji; nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi, owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa.
ימים על שנה תרגזנה בטחות כי כלה בציר אסף בלי יבוא
11 Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
חרדו שאננות רגזה בטחות פשטה וערה וחגורה על חלצים
12 Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
על שדים ספדים על שדי חמד על גפן פריה
13 Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
על אדמת עמי קוץ שמיר תעלה כי על כל בתי משוש קריה עליזה
14 Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
כי ארמון נטש המון עיר עזב עפל ובחן היה בעד מערות עד עולם--משוש פראים מרעה עדרים
15 Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.
עד יערה עלינו רוח ממרום והיה מדבר לכרמל וכרמל (והכרמל) ליער יחשב
16 A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara, ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ.
ושכן במדבר משפט וצדקה בכרמל תשב
17 Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.
והיה מעשה הצדקה שלום ועבדת הצדקה--השקט ובטח עד עולם
18 Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.
וישב עמי בנוה שלום ובמשכנות מבטחים ובמנוחת שאננות
19 A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile, a sikwa na e bibie obodo niile,
וברד ברדת היער ובשפלה תשפל העיר
20 ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ, mgbe unu na-agha mkpụrụ unu nʼakụkụ iyi, mgbe ehi unu na ịnyịnya ibu unu na-akpagharị na-aga ebe ọbụla ha chọrọ.
אשריכם זרעי על כל מים משלחי רגל השור והחמור

< Aịzaya 32 >