< Aịzaya 30 >

1 “Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
“Ègbé ni àwọn ọmọ fún orílẹ̀-èdè alágídí,” ni Olúwa wí, “Fún àwọn tí ó gbé ètò jáde tí kì í ṣe tèmi, tí wọ́n ń gbìmọ̀ pọ̀, ṣùgbọ́n kì í ṣe nípa Ẹ̀mí mi, tí wọ́n ń dá ẹ̀ṣẹ̀ lórí ẹ̀ṣẹ̀;
2 Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
tí wọ́n lọ sí Ejibiti láìṣe fún mi, tí ó ń wá ìrànlọ́wọ́ lọ́dọ̀ Farao fún ààbò, sí òjìji Ejibiti fún ibi ìsádi.
3 Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.
Ṣùgbọ́n ààbò Farao yóò jásí ìtìjú fún un yín, òjìji Ejibiti yóò mú àbùkù bá a yín.
4 Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans,
Bí àwọn olórí rẹ tilẹ̀ wà ní Ṣoani, tí àwọn ikọ̀ wọn sì ti dé sí Hanisi,
5 ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”
gbogbo wọn ni a ó dójútì, nítorí àwọn ènìyàn kan tí kò wúlò fún wọn, tí kò mú ìrànlọ́wọ́ tàbí àǹfààní wá, bí kò ṣe àbùkù àti ìdójúti ni.”
6 Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,
Ọ̀rọ̀-ìmọ̀ sí àwọn ẹranko tí ó wà ní gúúsù. Láàrín ilẹ̀ ìnira àti ìpọ́njú, ti kìnnìún àti abo kìnnìún ti paramọ́lẹ̀ àti ejò olóró, àwọn ikọ̀ náà kó ẹrù àti ọrọ̀ wọn lẹ́yìn àwọn kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́, àwọn ohun ìní wọn ní orí àwọn ìbákasẹ, sí orílẹ̀-èdè aláìlérè,
7 bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.
sí Ejibiti tí ìrànlọ́wọ́ rẹ̀ kò wúlò rárá. Nítorí náà mo pè é ní Rahabu aláìlẹ́ṣẹ̀ nǹkan kan.
8 Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.
Lọ nísinsin yìí, kí o sì kọ ọ́ sí ara wàláà fún wọn, tẹ̀ ẹ́ sí ara ìwé kíká, pé fún àwọn ọjọ́ tí ó ń bọ̀ kí ó sì lè jẹ́ ẹ̀rí ayérayé.
9 Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
Àwọn wọ̀nyí jẹ́ ọlọ̀tẹ̀ ènìyàn àti ẹlẹ́tanu ọmọ, àwọn ọmọ tí wọn kò ṣetán láti tẹ́tí sí ìtọ́ni Olúwa.
10 Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.
Wọ́n sọ fún àwọn aríran pé, “Ẹ má ṣe rí ìran mọ́!” Àti fún àwọn wòlíì, “Ẹ má ṣe fi ìran ohun tí ó tọ́ hàn wá mọ́! Ẹ sọ ohun tí ó tura fún wa, ẹ sàsọtẹ́lẹ̀ ẹ̀tàn.
11 Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
Ẹ fi ọ̀nà yìí sílẹ̀, ẹ kúrò ní ọ̀nà yìí ẹ dẹ́kun à ń dojú ìjà kọ wá pẹ̀lú Ẹni Mímọ́ Israẹli!”
12 Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
Nítorí náà, èyí ni ohun tí Ẹni Mímọ́ Israẹli wí: “Nítorí pé ẹ ti kọ ọ̀rọ̀ yìí sílẹ̀, ẹ gbára lé ìnilára kí ẹ sì gbẹ́kẹ̀lé ẹ̀tàn,
13 mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
ẹ̀ṣẹ̀ yìí yóò rí fún ọ gẹ́gẹ́ bí ògiri gíga, tí ó sán tí ó sì fì tí ó sì wó lójijì, àti ní ìṣẹ́jú kan.
14 Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
Yóò sì fọ́ ọ sí wẹ́wẹ́ bí àpáàdì tí a fọ́ pátápátá àti pé a kò ní rí ẹ̀rún kan nínú àfọ́kù rẹ̀, fún mímú èédú kúrò nínú ààrò tàbí gbígbọ́n omi jáde kúrò nínú àmù.” (questioned)
15 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
Èyí ni ohun tí Olúwa Olódùmarè, Ẹni Mímọ́ ti Israẹli wí: “Nínú ìrònúpìwàdà àti ìsinmi ni ìgbàlà rẹ wà, ní ìdákẹ́ jẹ́ẹ́ àti ìgbẹ́kẹ̀lé ni agbára rẹ wà, ṣùgbọ́n ìwọ kì yóò ní ọ̀kankan nínú wọn.
16 Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
Ẹ̀yin wí pé, ‘Bẹ́ẹ̀ kọ́, àwa yóò sálọ lórí ẹṣin.’ Nítorí náà ẹ̀yin yóò sá! Ẹ̀yin wí pé, ‘Àwa yóò gun àwọn ẹṣin tí ó yára lọ.’ Nítorí náà àwọn tí ń lé e yín yóò yára!
17 Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”
Ẹgbẹ̀rún yóò sá nípa ìdẹ́rùbà ẹnìkan; nípa ìdẹ́rùbà ẹni márùn-ún gbogbo yín lẹ ó sálọ, títí a ó fi yín sílẹ̀ àti gẹ́gẹ́ bí igi àsíá ní orí òkè, gẹ́gẹ́ bí àsíá lórí òkè.”
18 Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Síbẹ̀síbẹ̀ Olúwa sì fẹ́ síjú àánú wò ọ́; ó dìde láti ṣàánú fún ọ. Nítorí Olúwa jẹ́ Ọlọ́run ìdájọ́. Ìbùkún ni fún gbogbo àwọn tí ó dúró dè é!
19 Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
Ẹ̀yin ènìyàn Sioni, tí ń gbé ní Jerusalẹmu, ìwọ kì yóò sọkún mọ́. Báwo ni àánú rẹ̀ yóò ti pọ̀ tó nígbà tí ìwọ bá kígbe fún ìrànlọ́wọ́! Bí ó bá ti gbọ́, òun yóò dá ọ lóhùn.
20 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
Bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé Olúwa fún ọ ní àkàrà ìyà àti omi ìpọ́njú, àwọn olùkọ́ rẹ kì yóò fi ara sin mọ́; pẹ̀lú ojú rẹ ni ìwọ ó rí wọn.
21 Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
Bí o bá yí sápá ọ̀tún tàbí apá òsì, etí rẹ yóò máa gbọ́ ohùn kan lẹ́yìn rẹ, wí pé, “Ọ̀nà nìyìí, máa rìn nínú rẹ̀.”
22 Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”
Lẹ́yìn náà ni ẹ ó ba àwọn ère yín jẹ́ àwọn tí ẹ fi fàdákà bò àti àwọn ère tí ẹ fi wúrà bò pẹ̀lú, ẹ ó sọ wọ́n nù bí aṣọ tí obìnrin fi ṣe nǹkan oṣù ẹ ó sì wí fún wọn pé, “Ẹ kúrò níbí!”
23 Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.
Òun yóò sì rọ òjò fún un yín sí àwọn irúgbìn tí ẹ gbìn sórí ilẹ̀, oúnjẹ tí yóò ti ilẹ̀ náà wá yóò ní ọ̀rá yóò sì pọ̀. Ní ọjọ́ náà ni àwọn ẹran ọ̀sìn yín yóò máa jẹ koríko ní pápá oko tútù tí ó tẹ́jú.
24 Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.
Àwọn màlúù àti àwọn kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́ tí ó ń tú ilẹ̀ yóò jẹ oúnjẹ àdídùn tí a fi àmúga àti ṣọ́bìrì fọ́nkálẹ̀.
25 Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.
Ní ọjọ́ tí ọ̀pọ̀lọpọ̀ yóò sọ ẹ̀mí wọn nù nígbà tí ilé ìṣọ́ yóò wó lulẹ̀, odò omi yóò sàn lórí òkè gíga àti lórí àwọn òkè kékeré.
26 Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
Òṣùpá yóò sì tàn bí oòrùn, àti ìtànṣán oòrùn yóò mọ́lẹ̀ ní ìlọ́po méje, gẹ́gẹ́ bí ìmọ́lẹ̀ odidi ọjọ́ méje, nígbà tí Olúwa yóò di ojú ọgbẹ́ àwọn ènìyàn rẹ̀ tí yóò sì wo ọgbẹ́ tí ó ti dá sí wọn lára sàn.
27 Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.
Kíyèsi i, orúkọ Olúwa ti òkèèrè wá pẹ̀lú ìbínú gbígbóná àti kurukuru èéfín tí ó nípọn; ètè rẹ̀ kún fún ìbínú ahọ́n rẹ̀ sì jẹ́ iná ajónirun.
28 Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha.
Èémí rẹ̀ sì dàbí òjò alágbára, tí ó rú sókè dé ọ̀run. Ó jọ àwọn orílẹ̀-èdè nínú kọ̀ǹkọ̀sọ̀; ó sì fi sí ìjánu ní àgbọ̀n àwọn ènìyàn láti ṣì wọ́n lọ́nà.
29 Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.
Ẹ̀yin ó sì kọrin gẹ́gẹ́ bí i ti alẹ́ tí ẹ̀ ń ṣe àjọyọ̀ àpéjọ mímọ́, ọkàn yín yóò yọ̀ gẹ́gẹ́ bí ìgbà tí àwọn ènìyàn gòkè lọ pẹ̀lú fèrè sí orí òkè Olúwa, àní sí àpáta Israẹli.
30 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
Olúwa yóò jẹ́ kí wọn ó gbọ́ ohùn ògo rẹ̀ yóò sì jẹ́ kí wọ́n rí apá rẹ̀ tí ó ń bọ̀ wálẹ̀ pẹ̀lú ìbínú gbígbóná àti iná ajónirun, pẹ̀lú mọ̀nàmọ́ná, àrá àti yìnyín.
31 Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
Ohùn Olúwa yóò fọ́ Asiria túútúú, pẹ̀lú ọ̀pá aládé rẹ̀ ni yóò lù wọ́n bolẹ̀.
32 Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
Ẹgba kọ̀ọ̀kan tí Olúwa bá gbé lé wọn pẹ̀lú ọ̀pá ìjẹníyà rẹ̀ yóò jẹ́ ti ṣaworo àti ti dùùrù, gẹ́gẹ́ bí ó ti ń bá wọn jà lójú ogun pẹ̀lú ìkùùkuu láti apá rẹ̀.
33 Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga. A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ. Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi, na nke a kwajuru nkụ. Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.
A ti tọ́jú Tofeti sílẹ̀ tipẹ́tipẹ́, a ti tọ́jú rẹ̀ sílẹ̀ fún ọba. Ojú ààrò rẹ̀ ni a ti gbẹ́ jì tí ó sì fẹ̀, pẹ̀lú ọ̀pọ̀lọpọ̀ iná àti igi ìdáná; èémí Olúwa, gẹ́gẹ́ bí ìṣàn sulfuru ń jó ṣe mú un gbiná.

< Aịzaya 30 >