< Aịzaya 3 >
1 Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
Kíyèsi i, Olúwa, Olúwa àwọn ọmọ-ogun, fẹ́ mú ìpèsè àti ìrànlọ́wọ́ kúrò ní Jerusalẹmu àti Juda gbogbo ìpèsè oúnjẹ àti ìpèsè omi.
2 Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
Àwọn akíkanjú àti jagunjagun, adájọ́ àti wòlíì, aláfọ̀ṣẹ àti alàgbà,
3 na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.
balógun àádọ́ta àti àwọn ènìyàn, onípò gíga; olùdámọ̀ràn, oníṣọ̀nà tí ó dáńtọ́ àti ògbójú oníṣègùn.
4 “Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”
“Èmi ó sọ àwọn ọ̀dọ́mọkùnrin di aláṣẹ wọn, ọ̀dọ́mọdé lásán làsàn ni yóò sì máa jẹ ọba lórí i wọn.”
5 Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
Àwọn ènìyàn yóò sì máa pọ́n ọmọnìkejì, wọn lójú ẹnìkan sí ẹnìkejì rẹ̀, aládùúgbò sí aládùúgbò rẹ̀. Àwọn ọ̀dọ́ yóò gbógun ti àwọn àgbàgbà, àwọn mẹ̀kúnnù yóò dìde sí ọlọ́lá.
6 Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
Ọkùnrin kan yóò di ọ̀kan nínú àwọn arákùnrin rẹ̀ mú, nínú ilé baba rẹ̀, yóò sì wí pé, “Ìwọ́ ní aṣọ, ìwọ máa ṣe olórí wa, sì mójútó àwọn ahoro wọ̀nyí!”
7 Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
Ṣùgbọ́n ní ọjọ́ náà ni yóò figbe bọnu pé, “Èmi kò ní àtúnṣe kan. Èmi kò ní oúnjẹ, bẹ́ẹ̀ ni n ó ní aṣọ nílé, ẹ má fi mí ṣe olórí àwọn ènìyàn náà.”
8 Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
Jerusalẹmu ń ta gbọ̀nọ́ngbọ̀nọ́n Juda ń ṣubú lọ, ọ̀rọ̀ àti ìṣe wọn lòdì sí Olúwa, láti mú ojú ògo rẹ̀ bínú.
9 Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
Ìwò ojú wọn ń jẹ́rìí lòdì sí wọn, wọ́n ń polongo ẹ̀ṣẹ̀ wọn bí i Sodomu; wọn ò fi pamọ́! Ègbé ni fún wọn! Wọ́n ti mú ìparun wá sórí ara wọn.
10 Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
Ẹ sọ fún olódodo pé yóò dára fún wọn, nítorí ní àjẹgbádùn ni wọn yóò jẹ èso iṣẹ́ ẹ wọn.
11 Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
Ègbé ni fún ènìyàn búburú! Ìparun wà lórí i wọn, a ó sì san èrè iṣẹ́ tí ọwọ́ wọn ti ṣe fún wọn.
12 Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
Àwọn ọ̀dọ́mọdé ni o ń pọ́n àwọn ènìyàn mi lójú àwọn obìnrin ń jẹ ọba lé wọn lórí. Háà! Ènìyàn mi àwọn afinimọ̀nà yín ti ṣì yín lọ́nà, wọn sì mú yín kúrò ní ipa ọ̀nà yín.
13 Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
Olúwa bọ sí ipò rẹ̀ ní ìtẹ́ ìdájọ́ Ó dìde láti dá àwọn ènìyàn lẹ́jọ́.
14 Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
Olúwa dojú ẹjọ́ kọ àwọn àgbàgbà àti àwọn olórí àwọn ènìyàn rẹ̀. “Ẹ̀yin ni ẹ ti run ọgbà àjàrà mi, ogún àwọn tálákà ń bẹ̀ nínú ilé yín.
15 Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
Kín ni èrò yín láti máa run àwọn ènìyàn mi túútúú tí ẹ sì fojú àwọn tálákà ni gbolẹ̀?” ni Olúwa wí, Olúwa àwọn ọmọ-ogun.
16 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
Olúwa wí pé, “Àwọn obìnrin Sioni jẹ́ agbéraga, wọn ń rìn lọ pẹ̀lú ọrùn tí ó nà tàntàn, tí wọn ń fojú pe ọkùnrin, tí wọn ń sọ̀dí bí wọ́n ti ń yan lọ pẹ̀lú ohun ọ̀ṣọ́ tí ń mì wọnjanwọnjan lọ́rùn ẹsẹ̀ wọn.
17 Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
Nítorí náà Olúwa yóò mú egbò wá sórí àwọn obìnrin Sioni, Olúwa yóò sì pá wọn ní agbárí.”
18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
Ní ọjọ́ náà, Olúwa yóò já ọ̀ṣọ́ wọn gbà kúrò ti ọwọ́ àti gèlè àti ẹ̀gbà ọrùn tí ó dàbí òṣùpá
19 ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
gbogbo yẹtí, ẹ̀gbà ọwọ́ àti ìbòjú,
20 ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
gbogbo gèlè, ẹ̀gbà ọrùn, ẹsẹ̀ àti àyà, àwọn ìgò tùràrí àti òògùn,
21 ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile,
òrùka ọwọ́ àti ti imú,
22 ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
àwọn àtàtà aṣọ, àwọ̀lékè, agbádá àti àpamọ́wọ́,
23 ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
dígí wọn, aṣọ funfun nigínnigín ìbòrí àti ìbòjú.
24 Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
Dípò òórùn dídùn, òórùn búburú ni yóò wá, okùn ni yóò wà dípò àmùrè, orí pípá ni yóò dípò irun ti a ṣe ní ọ̀ṣọ́ aṣọ ọ̀fọ̀ ni yóò dípò aṣọ ẹ̀yẹ ìjóná dípò ẹwà.
25 Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
Àwọn ọkùnrin rẹ yóò ti ipa idà ṣubú, àti àwọn jagunjagun rẹ̀ lójú ogun.
26 Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
Àwọn bodè Sioni yóò sọkún kíkorò, wọn ó ṣọ̀fọ̀, nítorí ó dahoro, yóò jókòó ní orí ilẹ̀.