< Aịzaya 3 >

1 Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
Porque he aquí que el Señor DIOS de los ejércitos quita de Jerusalén y de Judá al sustentador y la sustentadora, todo sustento de pan y todo socorro de agua;
2 Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
el valiente, y el hombre de guerra, el juez, y el profeta, el adivino, y el anciano;
3 na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.
el capitán de cincuenta, y el hombre de respeto, y el consejero, y el artífice excelente, y el sabio de elocuencia.
4 “Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”
Y les pondrá niños por príncipes, y muchachos serán sus señores.
5 Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
Y el pueblo hará violencia los unos a los otros, cada cual contra su vecino; el niño se levantará contra el viejo, y el villano contra el noble.
6 Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
Cuando alguno tomare de la mano a su hermano, de la familia de su padre, y le dijere: ¿Que vestido tienes? Tú serás nuestro príncipe, y sea en tu mano esta ruina;
7 Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
él jurará aquel día, diciendo: No tomaré ese cuidado; porque en mi casa ni hay pan, ni qué vestir; no me hagáis príncipe del pueblo.
8 Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
Pues arruinada está Jerusalén, y Judá ha caído; porque la lengua de ellos y sus obras han sido contra el SEÑOR, para irritar los ojos de su majestad.
9 Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
La prueba del rostro de ellos los convence; que como Sodoma predican su pecado, no lo disimulan. ¡Ay del alma de ellos! Porque allegaron mal para sí.
10 Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
Decid al justo que le irá bien, porque comerá de los frutos de sus manos.
11 Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
¡Ay del impío! Mal le irá, porque según las obras de sus manos le será pagado.
12 Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
Los opresores de mi pueblo son muchachos, y mujeres se enseñorearon de él. Pueblo mío, los que te guían te engañan, y tuercen la carrera de tus caminos.
13 Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
El SEÑOR está en pie para litigar, y está para juzgar a los pueblos.
14 Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
El SEÑOR vendrá a juicio contra los ancianos de su pueblo, y contra sus príncipes; porque vosotros habéis devorado la viña, y el despojo del pobre está en vuestras casas.
15 Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
¿Qué pensáis vosotros que majáis mi pueblo, y moléis las caras de los pobres? Dice el Señor DIOS de los ejércitos.
16 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
Asimismo dice el SEÑOR: Por cuanto las hijas de Sion se ensoberbecen, y andan con cuello erguido y los ojos descompuestos; y cuando andan, van como danzando, y haciendo son con los pies;
17 Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
por tanto, pelará el Señor la mollera de las hijas de Sion, y el SEÑOR descubrirá sus vergüenzas.
18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
Aquel día quitará el Señor el atavío de los calzados, y las redecillas, y las lunetas;
19 ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
los collares, y los joyeles, y los brazaletes;
20 ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
las escofietas, y los atavíos de las piernas, los partidores del pelo, los pomitos de olor, y los zarcillos;
21 ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile,
los anillos, y los joyeles de las narices;
22 ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
las ropas de remuda, los mantoncillos, los velos, y los alfileres;
23 ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
los espejos, los pañizuelos, las gasas, y los tocados.
24 Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
Y será que en lugar de los perfumes aromáticos vendrá hediondez; y desgarrón en lugar de cinta; y calvicie en lugar de la compostura del cabello; y en lugar de faja ceñimiento de cilicio; y quemadura en vez de hermosura.
25 Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
Tus varones caerán a cuchillo, y tu fuerza en la guerra.
26 Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
Sus puertas se entristecerán y enlutarán, y ella, desamparada, se sentará en tierra.

< Aịzaya 3 >