< Aịzaya 29 >

1 Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel, gị obodo ebe Devid bi. Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.
Woe to Ariel, to Ariel, The city where David dwelt! Add year to year, Let the festivals go round,
2 Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
Then will I distress Ariel; Mourning and sorrow shall be there; Yet shall she be to me as Ariel [[the lion of God]].
3 Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
I will encamp against thee round about, And I will lay siege against thee with a mound, And I will raise towers against thee.
4 Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
Thou shalt be brought down, and speak from the ground, And thy speech shall be low from the dust; Thy voice shall be like that of a spirit under ground, And thy speech shall chirp as from the dust.
5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
Yet shall the multitude of thine enemies be like fine dust; The multitude of the terrible like flying chaff; It shall take place suddenly, in a moment.
6 mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.
From Jehovah of hosts cometh the visitation With thunder, and earthquake, and great noise, With storm and tempest, And flames of devouring fire.
7 Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha, bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha, ga-efu dịka nrọ, onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.
As a dream, a vision of the night, Shall be the multitude of all the nations That fight against Ariel, That fight against her and her fortress, And distress her.
8 Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.
As a hungry man dreameth, and lo! he eateth, But awaketh and is still hungry; And as a thirsty man dreameth, and lo! he drinketh, But awaketh, and lo! he is faint and thirsty; So shall it be with the multitude of all the nations That fight against mount Zion.
9 Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
Be in amazement and be amazed! Be blinded and be blind! They are drunk, but not with wine; They stagger, but not with strong drink!
10 Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
For Jehovah hath poured upon you a spirit of slumber; He hath closed your eyes, the prophets, And covered your heads, the seers;
11 Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
And so every vision is to you as the words of a sealed book, Which is given to a man that is skilled in writing, Saying, “Read this, I pray thee”; But he answereth, “I cannot, for it is sealed.”
12 Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”
Or, if he give it to one that is not skilled in writing, Saying, “Read this, I pray thee,” He answereth, “I am not skilled in writing.”
13 Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
Therefore saith the Lord, Since this people draweth near to me with their mouth, And honoreth me with their lips, While their heart is far from me, And their worship of me is according to the commandments of men,
14 Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
Therefore, behold, I will proceed to deal marvellously with this people; Marvellously and wonderfully, For the wisdom of their wise men shall perish, And the prudence of the prudent shall be hid.
15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
Woe to them that hide deep their purposes from Jehovah, Whose work is in darkness; That say, Who seeth us? Who knoweth us?
16 Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?
Alas, your perverseness! Is the potter to be esteemed as the clay, That the work should say of its maker, He made me not? And the thing formed say of him that formed it, He hath no understanding?
17 Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
Is it not yet a very little while, And Lebanon shall be changed to a fruitful field, And the fruitful field be esteemed a forest.
18 Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.
And in that day shall the deaf hear the words of the book, And out of mist and darkness shall the eyes of the blind see.
19 Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
The afflicted shall exceedingly rejoice in Jehovah, And the poor shall exult in the Holy One of Israel.
20 Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,
For the oppressor hath come to naught; the scoffer is destroyed; And all that watched for iniquity are cut off;
21 bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
Who condemned a man in his cause, And laid snares for him who defended himself in the gate, And with falsehood caused the righteous to fail.
22 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
Therefore concerning the house of Jacob thus saith Jehovah, He that redeemed Abraham: No more shall Jacob be ashamed, And no more shall his face grow pale.
23 Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.
For when his children behold the work of my hands in the midst of them, They shall honor my name. They shall honor the Holy One of Jacob, And reverence the God of Israel.
24 Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”
They that erred in spirit shall come to understanding, And the obstinate shall receive instruction.

< Aịzaya 29 >