< Aịzaya 26 >
1 Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.
その日ユダの國にてこの歌をうたはん われらに堅固なる邑あり 神すくひをもてその垣その藩となしたまふべし
2 Meghee ụzọ ama niile, ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata, e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
なんぢら門をひらきて忠信を守るただしき國民をいれよ
3 Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
なんぢは平康にやすきをもて心志かたき者をまもりたまふ 彼はなんぢに依賴めばなり
4 Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
なんぢら常盤にヱホバによりたのめ 主ヱホバはとこしへの巌なり
5 Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala, na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala. Mgbidi ya ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
たかきに居るものを仆し そびえたる城をふせしめ 地にふせしめて塵にまじへ給へり
6 Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
かくて足これをふまん 苦しむものは足にて之をふみ 貧しき者はその上をあゆまん
7 Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.
義きものの道は直からざるなし なんぢ義きものの途を直く平らかにし給ふ
8 E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
ヱホバよ審判をおこなひたまふ道にてわれら汝をまちのぞめり われらの心はなんぢの名となんぢの記念の名とをしたふなり
9 Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
わがこころ夜なんぢを慕ひたり わがうちなる靈あしたに汝をもとめん そは汝のさばき地におこなはるるとき世にすめるもの正義をまなぶべし
10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.
惡者はめぐまるれども公義をまなばず 直き地にありてなほ不義をおこなひヱホバの稜威を見ることをこのまず
11 Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.
ヱホバよなんぢの手たかく擧れどもかれら顧みず 然どなんぢが民をすくひたまふ熱心を見ばはぢをいだかん 火なんぢの敵をやきつくすべし
12 Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.
ヱホバよ汝はわれらのために平和をまうけたまはん 我儕のおこなひしことは皆なんぢの成たまへるなり
13 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
ヱホバわれらの神よなんぢにあらぬ他の主ども曩にわれらを治めたり 然どわれらはただ汝によりて汝の名をかたりつげん
14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.
かれら死たればまたいきず 亡靈となりたればまた復らず なんぢかれらを糺してこれを滅ぼし その記念の名をさへ悉くうせしめたまへり
15 I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
ヱホバよなんぢこの國民をましたまへり此くにびとを増たまへり なんぢは尊ばれたまふ なんぢ地の界をことごとく擴めたまへり
16 Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
ヱホバよかれら苦難のときに汝をあふぎのぞめり 彼等なんぢの懲罰にあへるとき切になんぢに禱告せり
17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
ヱホバよわれらは孕める婦のうむとき近づきてくるしみ その痛みによりて叫ぶがごとく汝のまへに然ありき
18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze, ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya. Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka. O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
われらは孕みまた苦しみたれどその產るところは風ににたり われら救を地にほどこさず世にすむ者うまれいでざりき
19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.
なんぢの死者はいきわが民の屍はおきん 塵にふすものよ醒てうたうたふべし なんぢの露は草木をうるほす露のごとく地はなきたまをいださん
20 Baanụ nʼụlọ, ndị m, kpọchienụ ụzọ unu! Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta, tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.
わが民よゆけ なんぢの室にいり汝のうしろの戸をとぢて忿恚のすぎゆくまで暫時かくるべし
21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
視よヱホバはその處をいでて地にすむものの不義をただしたまはん 地はその上なる血をあらはにして殺されたるものをまた掩はざるべし