< Aịzaya 26 >

1 Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.
Tsiku limenelo anthu a mʼdziko la Yuda adzayimba nyimbo iyi. Tili ndi mzinda wolimba. Mulungu amawuteteza ndi zipupa ndi malinga.
2 Meghee ụzọ ama niile, ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata, e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Tsekulani zipata za mzinda kuti mtundu wolungama ndi wokhulupirika ulowemo.
3 Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
Inu mudzamupatsa munthu wa mtima wokhazikika mtendere weniweni.
4 Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
Mudalireni Yehova mpaka muyaya, chifukwa Yehova Mulungu ndiye Thanthwe losatha.
5 Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala, na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala. Mgbidi ya ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
Iye amatsitsa anthu amene amadziyika pamwamba, iye amagwetsa pansi mzinda wodzitukumula, amagumula makoma ake ndi kuwagwetsa pansi pa fumbi penipeni.
6 Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
Mapazi a anthu akuwupondereza, mapazi a anthu oponderezedwa, mapazi anthu osauka.
7 Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.
Njira ya munthu wolungama ndi yosalaza, Inu Wolungamayo, mumasalaza njira ya wolungama.
8 E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
Inde Yehova, timayenda mʼnjira zanu zolungama, ife timayembekezera Inu; mitima yathu imakhumba kukumbukira ndi kulemekeza dzina lanu.
9 Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
Moyo wanga umalakalaka Inu usiku wonse; nthawi yammawa ndimafunafuna Inu. Pamene muweruza dziko lapansi anthu amaphunzira kuchita chilungamo.
10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.
Ngakhale mukomere mtima anthu oyipa, saphunzira chilungamo. Amachita zoyipa mʼdziko la chilungamo, ndipo sazindikira ululu wa Yehova.
11 Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.
Inu Yehova, mwatukula dzanja lanu kuti muwalange, koma iwo sakuliona dzanjalo. Aloleni anthu aone ndi kuchita manyazi poona mmene mukondera anthu anu; ndipo moto umene mwasonkhera adani anu uwapsereze.
12 Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.
Yehova, mumatipatsa mtendere; ndipo zonse zimene ife tinazichita munatichitira ndinu.
13 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
Inu Yehova Mulungu wathu, ngakhale takhala tikulamulidwa ndi ena mʼmalo mwanu, koma ife timalemekeza dzina lanu lokha.
14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.
Iwo tsopano sadzadzukanso; mizimu yawo sidzabwera kudzativutitsa pakuti mwawalanga ndipo mwawawononga; palibenso amene amawakumbukira.
15 I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
Inu Yehova, mwaukulitsa mtundu wathu; mwauchulukitsa ndithu ndipo mwalandirapo ulemu; mwaukuza mbali zonse za dziko.
16 Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
Yehova, anthu anu anabwera kwa Inu pamene anali mʼmasautso; pamene munawalanga, iwo anapemphera kwa Inu.
17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
Monga mayi woyembekezera pamene nthawi yake yobereka yayandikira amamva kupweteka ndipo amalira ndi ululu, ifenso tinali chimodzimodzi pamaso panu, Inu Yehova.
18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze, ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya. Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka. O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
Ife chimodzimodzi tinamva ululu, ngati mayi pa nthawi yobala mwana, koma sitinapindulepo kanthu, kapena kupulumutsa dziko lapansi; sitinabadwitse anthu atsopano pa dziko pano.
19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.
Koma anthu anu amene anafa adzakhalanso ndi moyo; matupi awo adzadzuka. Iwo amene ali ku fumbi tsopano adzadzuka ndi kuyimba mosangalala. Monga mame amafewetsa pansi kutsitsimutsa zomera, momwenso Yehova adzaukitsa anthu amene anafa kale.
20 Baanụ nʼụlọ, ndị m, kpọchienụ ụzọ unu! Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta, tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.
Abale anga, pitani mukalowe mʼnyumba zanu ndipo mukadzitsekere; mukabisale kwa kanthawi kochepa mpaka ukali wake utatha.
21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
Taonani, Yehova akubwera kuchokera kumene amakhala; akubwera kudzalanga anthu a dziko lapansi chifukwa cha machimo awo. Dziko lapansi lidzawulula magazi amene anakhetsedwa pa dzikolo; dziko lapansi silidzabisanso mitembo ya anthu ophedwa.

< Aịzaya 26 >