< Aịzaya 25 >

1 O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m; aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto, nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke, ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama, nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.
Yehova ndinu Mulungu wanga; ine ndidzakukwezani ndi kutamanda dzina lanu, pakuti mwachita zodabwitsa zimene munakonzekeratu kalekale mokhulupirika kwambiri.
2 Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.
Inu mwasandutsa mzinda uja kukhala mulu wamiyala. Ndipo mzinda wamalinga wasanduka bwinja, linga la anthu achilendo lero si mzindanso ndipo sidzamangidwanso.
3 Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị. Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.
Nʼchifukwa chake anthu amphamvu adzakulemekezani; mizinda ya mitundu ya anthu ankhanza idzakuopani.
4 Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba; ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha, ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo, na ndo nʼoge okpomọkụ. Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,
Inu mwakhala ngati populumukira pa anthu osauka, mwakhala ngati kobisalirako munthu wovutika pa nthawi ya masautso ake. Mwakhala ngati pobisalirapo pa nthawi ya mphepo yamkuntho ndi mthunzi pa nthawi ya dzuwa. Pakuti anthu ankhanza ali ngati mphepo yamkuntho yowomba pa khoma,
5 dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara. Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị, dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ, otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.
ndiponso ngati kutentha mʼdziko lowuma. Inu mumaletsa phokoso la anthu achilendo. Monga momwe mthunzi wa mtambo umachepetsa kutentha, inu munaletsa nyimbo za anthu ankhanza.
6 Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.
Pa phiri ili Yehova Wamphamvuzonse adzakonzera anthu a mitundu yonse madyerero a zakudya zokoma ndi vinyo wabwino. Phwando la nyama yonona ndi vinyo wabwino kwambiri.
7 Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.
Iye adzachotsa kulira kumene kwaphimba anthu ngati nsalu. Adzachotsa chinsalu chimene chakuta mitundu yonse ya anthu.
8 Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.
Yehova adzathetsa imfa mpaka muyaya, Ambuye Yehova adzapukuta misozi mʼmaso mwa munthu aliyense; adzachotsa manyazi a anthu ake pa dziko lonse lapansi, Yehova wayankhula.
9 Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
Tsiku limenelo iwo adzati, “Ndithudi, uyu ndiye Mulungu wathu; ife tinamudalira ndipo anatipulumutsa. Uyu ndiye Yehova, ife tinamudalira; tiyeni tikondwe ndi kusangalala chifukwa watipulumutsa.”
10 Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
Yehova adzateteza phiri limeneli ndi dzanja lake; ndipo Amowabu adzawapondereza pomwe alilipo, ngati mmene amapondera manyowa mʼdzenje.
11 Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya, dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya, ma Chineke ga-eweda mpako ha niile, nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.
Amowabuwo adzatambasula manja awo mʼmenemo, ngati mmene amachitira munthu wosambira. Koma Mulungu adzathetsa kunyada kwawo ngakhale luso la manja awo.
12 Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike, mee ka ha daruo ala, ọ ga-eme ka ha daruo ala, ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.
Iye adzagumula malinga awo ataliatali ndipo adzawagwetsa ndi kuwaponya pansi, pa fumbi penipeni.

< Aịzaya 25 >