< Aịzaya 24 >

1 Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ. Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa, mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.
Khangela, iNkosi yenza umhlaba ube yize, iwenze ube yincithakalo, yone ubuso bawo, ihlakaze abahlali bawo.
2 Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.
Kuzakuthi njengabantu kube njalo umpristi; njengesisebenzi kube njalo inkosi yaso; njengencekukazi kube njalo inkosikazi yayo; njengomthengi kube njalo umthengisi; njengombolekisi kube njalo obolekayo; njengomniki wesikwelede kube njalo okweledayo.
3 O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.
Umhlaba uzachitheka lokuchitheka, uphangwe lokuphangwa; ngoba iNkosi ilikhulumile lelilizwi.
4 Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.
Umhlaba uyalila, ubune, ilizwe liyadangala, libune; abantu bomhlaba abaphakemeyo bayadangala.
5 Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.
Umhlaba lawo ungcolisiwe ngaphansi kwabahlali bawo; ngoba beqile imilayo, baguqula isimiso, bephula isivumelwano esilaphakade.
6 Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.
Ngenxa yalokho isiqalekiso siwuqedile umhlaba, labahlala kuwo bayachitheka; ngakho-ke abahlali bomhlaba batshisiwe, njalo kusale abantu abalutshwana.
7 Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
Iwayini elitsha liyalila, ivini lidangale, bonke abanhliziyo ethokozayo bayabubula.
8 Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
Injabulo yezigubhu iphelile, umsindo wabajabulayo uphelile, intokozo yechacho iphelile.
9 Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa; mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
Kabayikunatha iwayini ngengoma; okunathwayo okulamandla kuzababa kwabakunathayo.
10 Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
Umuzi wencithakalo ubhidlikile, yonke indlu ivaliwe ukuze kungangenwa.
11 Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa. Ọṅụ adịghịkwa, otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.
Kukhalelwa iwayini ezitaladeni; intokozo yonke ifiphele, injabulo yomhlaba inyamalele.
12 Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe, e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.
Emzini kusele incithakalo, lesango litshayiwe lachithwa.
13 Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile, nakwa nʼetiti mba niile, dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv, maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.
Ngoba kuzakuba njalo phakathi kwelizwe, phakathi kwabantu, njengokunyikinywa kwesihlahla somhlwathi, njengokukhothoza sesiphelile isivuno sezithelo zevini.
14 Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.
Bona bazaphakamisa ilizwi labo, bazahlabelela ubukhosi beNkosi, bamemeze beselwandle.
15 Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.
Ngenxa yalokhu dumisani iNkosi emililweni, ibizo leNkosi uNkulunkulu kaIsrayeli ezihlengeni zolwandle.
16 Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
Sizwile amahubo avela emkhawulweni womhlaba, udumo kolungileyo. Kodwa ngathi: Ukucaka kwami, ukucaka kwami! Maye kimi! Abenzi benkohliso benze ngokukhohlisa; yebo abenzi benkohliso benze ngokukhohlisa okukhulu.
17 Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.
Ukwesaba lomgodi lomjibila kuphezu kwakho, wena mhlali womhlaba.
18 Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
Kuzakuthi-ke obalekela umsindo wokwesaba awele emgodini; lowenyuka phakathi komgodi abanjwe ngumjibila; ngoba amawindi aphezulu avulekile, lezisekelo zomhlaba ziyaqhaqhazela.
19 Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.
Umhlaba wephukile lokwephuka, umhlaba udatshudatshuliwe, umhlaba uyanyikinyeka kakhulu.
20 Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu. Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị. Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ, nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.
Umhlaba uzadiyazela lokudiyazela njengesidakwa, uzunguzeke njengedumba; lesiphambeko sawo sizakuba nzima phezu kwawo; uzakuwa, ungabe usavuka futhi.
21 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ. Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.
Kuzakuthi-ke ngalolosuku iNkosi ijezise ibutho labaphakemeyo abaphezulu, lamakhosi omhlaba phezu komhlaba.
22 A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.
Bazabuthelwa ndawonye njengezibotshwa zibuthelwa emgodini, bavalelwe entolongweni, langemva kwensuku ezinengi bethekelelwe.
23 Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.
Khona inyanga izayangeka, lelanga libe lenhloni, ngoba iNkosi yamabandla iyabusa entabeni iZiyoni laseJerusalema, laphambi kwabadala kuzakuba khona inkazimulo.

< Aịzaya 24 >