< Aịzaya 23 >

1 Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs. 2 Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa. 3 Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche. 4 Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.” 5 Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa. 6 Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu. 7 Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ? 8 Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa? 9 Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị. 10 Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11 Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12 Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13 Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14 Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike. 15 A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16 “Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.” 17 E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. 18 Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

< Aịzaya 23 >