< Aịzaya 19 >

1 Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
KA wanana no Aigupita. Aia hoi, ke holo la o Iehova maluna o ke ao mama, A hele mai koi ia i Aigupita. E haalulu auanei na akua kii o Aigupita imua o kona alo, E maule hoi ka naau o ko Aigupita iloko o lakou.
2 “Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
E kahiko aku no wau i ko Aigupita, e kaua i ko Aigupita; E kaua no lakou, o kela mea keia mea i kona hoahanau iho, O kela mea keia mea i kona makamaka iho, O kekahi kulanakauhale i kekahi kulanakauhale, O kekahi aupuni i kekahi aupuni.
3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.
E pau auanei ke aho o ko Aigupita iloko o lakou; E kookahuli au i ko lakou manao; Alaila, e huli lakou i ko lakou akuakii, I na mea namunamu, a me na mea ninau kupapau, a me na kupua.
4 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
E haawi aku no wau i ko Aigupita, i ka lima o ka haku oolea; A noho no kekahi alii oolea maluna o lakou, Wahi a ka Haku, o Iehova o na kaua.
5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.
E pau auanei ka wai o ka muliwai, E pio no hoi a maloo ke kahawai.
6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
E pilau auanei na muliwai, E pio, a maloo na auwai o Aigupita, A e mae wale no hoi ka naku a me ke kaluha.
7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.
O na papu ma kapa muliwai, a me ka waha o ka muliwai, A me na mea hua a pau ma ka muliwai, e maloo no ia mau mea, E puehu liilii ia no, a e nalowale.
8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
E kauiuhu no na lawaia, a me ka uwe iho, O ka poe a pau i kuu i ka makau ma ka muliwai, Ka poe i hohola i na upena maluna o na wai, E u auanei lakou.
9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
O ka poe i hana i ke olona i kahiia, A me ka poe ulana i ka lole keokeo, E hilahila auanei lakou.
10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
E hehiia no na mea koikoi, A e kaumaha no hoi ka naau o ka poe paaua a pau.
11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
He oiaio, ua naaupo na'lii o Zoana; O ka oleloao o na kakaolelo akamai o Parao, He olelo lapuwale ia. Pehea la oukou e olelo ai ia Parao, He keiki au na ka poe akamai, He keiki na na'lii kahiko?
12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
Auhea lakou? Auhea kou poe akamai? Na lakou e hai mai ia oe, A e ike lakou i ka mea a Iehova o na kaua, E manao ai no Aigupita.
13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu, ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie; ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile eduhiela ndị Ijipt ụzọ.
Ua naaupo no na'lii o Zoana, Ua puni na'lii o Nopa; Ua alakai hewa lakou i ko Aigupita, o na luna hoi o na ohana ona.
14 Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
Ua ninini mai o Iehova iwaena o lakou, i ka manao pihoihoi; A alakai hewa lakou i ko Aigupita ma kana mau hana a pau, Ua like me ka mea i ona, e hikaka ana maloko o kona luai.
15 Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
Aole e hanaia ka hana ma Aigupita, Ka mea a ke poo e hiki ai ke hana, a me ka huelo; Ka lala pama, a me ka naku.
16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
Ia la la, e like auanei ko Aigupita me na wahine, E makau no lakou a haalulu, No ke ka ana o ka lima o Iehova o na kaua, Ka mea ana e hooka mai ai maluna o lakou.
17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
E lilo no ka aina o ka Iuda, i mea e makau ai ko Aigupita, O na mea a pau o lakou i hoomanao ia wahi, e makau loa auanei, No ka manao ana o Iehova o na kaua, Ka mea ana i manao ai no lakou.
18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
Ia la la, elima no kulanakauhale ma ka aina o Aigupita, E olelo ana i ka olelo o Kanaana; A ma ka inoa o Iehova o na kaua lakou e hoohiki ai; A e kapaia kekahi o lakou, ke kulanakauhale o Heresa.
19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
Ia la la e hanaia ke kuahu no Iehova, Iwaenakonu o ka aina o Aigupita, He puu no Iehova ma kolaila mau palena:
20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
He hoailona no ia, a he mea hoike hoi, No Iehova o na kaua, ma ka aina o Aigupita; No ko lakou hea ana ia Iehova i ko lakou hookaumahaia, A e hoouna mai oia no lakou i mea hoola, I mea mana hoi, nana lakou e hoopakele.
21 Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
Alaila, e ikeia o Iehova e ko Aigupita, A e hoomaopopo no ko Aigupita ia Iehova i kela la, A e malama lakou ia ia i ka mohai, a me ka alana; A e hoohiki lakou i ka hoohiki ana no Iehova, A e hooko io aku lakou.
22 Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
E hahau aku no o Iehova i ko Aigupita, E hahau aku no, a e hoola aku: A e huli no lakou ia Iehova, A e noiia oia e lakou, a e hoola mai oia ia lakou.
23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
Ia la la, e loaa no ke alanui, mai Aigupita aku a Asuria, A e hele no ko Asuria i Aigupita, A me ko Aigupita hoi i Asuria; A e malama pu no ko Aigupita me ko Asuria.
24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
Ia la la, o ka Iseraela ke kolu, o Aigupita pu, a me Asuria, O ka pomaikai hoi iwaena o ka honua:
25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”
Ka mea a Iehova o na kaua i hoopomaikai ai, I ka i ana mai, Pomaikai ko'u poe kanaka, o ko Aigupita, A me ko Asuria hoi ka hana a ko'u mau lima, A me ka Iseraela ko'u hooilina.

< Aịzaya 19 >