< Aịzaya 16 >

1 Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
Fi ọ̀dọ́-àgùntàn ṣe ẹ̀bùn ránṣẹ́ sí aláṣẹ ilẹ̀ náà, láti Sela, kọjá ní aginjù, lọ sí orí òkè ọ̀dọ́mọbìnrin Sioni.
2 Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
Gẹ́gẹ́ bí alárìnkiri ẹyẹ tí a tì jáde kúrò nínú ìtẹ́, bẹ́ẹ̀ gẹ́gẹ́ ni àwọn obìnrin Moabu ní àwọn ìwọdò Arnoni.
3 Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
“Fún wa ní ìmọ̀ràn ṣe ìpinnu fún wa. Jẹ́ kí òjìji rẹ dàbí òru, ní ọ̀sán gangan. Fi àwọn ìsáǹsá pamọ́, má ṣe fi àwọn aṣàtìpó han.
4 Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
Jẹ́ kí àwọn ìsáǹsá Moabu gbé pẹ̀lú rẹ, jẹ́ ààbò fún wọn kúrò lọ́wọ́ ìparun.” Aninilára yóò wá sí òpin, ìparun yóò dáwọ́ dúró; òfinràn yóò pòórá kúrò lórí ilẹ̀.
5 A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.
Nínú ìfẹ́ a ó fi ìdí ìjọba kan múlẹ̀, ní òdodo ọkùnrin kan yóò jókòó lórí rẹ̀ ẹnìkan láti ilé Dafidi wá. Ẹni yóò ṣe ìdájọ́, yóò sì máa wá ìdájọ́, yóò sì máa yára wá ohun tí í ṣe òdodo.
6 Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
Àwa ti gbọ́ nípa ìgbéraga Moabu, ìwọ̀sí ìgbéraga rẹ̀ àti fùlenge fùlenge, gààrù rẹ̀ àti àfojúdi rẹ̀, ṣùgbọ́n ìfọ́nnu rẹ̀ jẹ́ ìmúlẹ̀mófo.
7 Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
Nítorí náà ni àwọn ará Moabu hu, wọ́n jùmọ̀ hu lórí Moabu. Sọkún kí o sì banújẹ́ fún àkàrà díndín Kiri-Hareseti.
8 Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.
Gbogbo pápá oko Heṣboni ti gbẹ, bákan náà ni àjàrà Sibma rí. Àwọn aláṣẹ àwọn orílẹ̀-èdè wọ́n tẹ àwọn àyànfẹ́ àjàrà mọ́lẹ̀, èyí tí ó ti fà dé Jaseri ó sì ti tàn dé agbègbè aginjù. Àwọn èhíhù rẹ̀ fọ́n jáde, ó sì lọ títí ó fi dé Òkun.
9 Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
Nítorí náà mo sọkún, gẹ́gẹ́ bí Jaseri ṣe sọkún, fún àwọn àjàrà Sibma. Ìwọ Heṣboni, ìwọ Eleale, mo bomirin ọ́ pẹ̀lú omi ojú! Igbe ayọ̀ lórí àwọn èso pípọ́n rẹ àti lórí ìkórè èyí tí o ti mọ́wọ́ dúró.
10 Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
Ayọ̀ àti ìdùnnú ni a ti mú kúrò nínú ọgbà-igi eléso rẹ; kò sí ẹnìkan tí ó kọrin tàbí kígbe nínú ọgbà àjàrà: ẹnikẹ́ni kò fún ọtí níbi ìfúntí, nítorí mo ti fi òpin sí gbogbo igbe.
11 Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
Ọkàn mi kérora fún Moabu gẹ́gẹ́ bí i dùùrù, àní tọkàntọkàn mi fún ìlú Kiri-Hareseti.
12 Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.
Nígbà tí Moabu farahàn ní ibi gíga rẹ̀, ó ṣe ara rẹ̀ ní wàhálà lásán; nígbà tí ó lọ sí ojúbọ rẹ̀ láti gbàdúrà òfo ni ó jásí.
13 Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,
Èyí ni ọ̀rọ̀ tí Olúwa ti sọ nípa Moabu.
14 ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”
Ṣùgbọ́n ní àkókò yìí Olúwa wí pé, “Láàrín ọdún mẹ́ta gẹ́gẹ́ bí ìwọ̀fà tí ó wà lábẹ́ ìdè ọgbà rẹ̀ ti máa kà á, ògo Moabu àti àwọn ọ̀pọ̀ ènìyàn rẹ̀ ni a ó kẹ́gàn, àwọn tí ó sálà nínú rẹ̀ yóò kéré níye, wọn yóò sì jẹ́ akúrẹtẹ̀.”

< Aịzaya 16 >