< Aịzaya 15 >

1 Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
Ko te poropititanga mo Moapa. He po kotahi ka ngaro a Ara o Moapa, a kore iho; he po ano hoki, ka ngaro a Kiri o Moapa, a kore iho.
2 Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
Kua riro ia ki runga ki Paiti, ki Ripono, ki nga wahi tiketike tangi ai: ka auetia e Moapa a Nepo raua ko Merepa; he mea moremore katoa o ratou mahunga, tapahi rawa nga kumikumi katoa.
3 Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.
Ko o ratou whitiki i o ratou ara he kakahu taratara: ka aue ratou katoa i runga i o ratou whare, i o ratou waharoa, nui atu te tangi.
4 Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.
Ka hamama hoki a Hehepona raua ko Ereare: ka rangona to ratou reo i Iahata rawa: no reira hamama ana nga mau patu o Moapa; ka wiri tona wairua i roto i a ia.
5 Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
E tangi ana toku ngakau ki a Moapa; rere ana ona rangatira ki Toara, ki Ekarata Herihia: he tangi nei hoki ta ratou i te pikitanga ki Ruhiti, i te mea e piki ana i reira; i te ara hoki ki Horonaimi ka pa ta ratou karanga o te ngaromanga.
6 Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
Ka takoto kau noa nga wai o Nimirimi: kua maroke hoki te tarutaru, kua mate te otaota, kahore he mea e tupu ana.
7 Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
Na, ko a ratou mea maha, me a ratou mea i te rongoa, ka kawea e ratou ki te awa i nga wirou.
8 Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
Kua taiawhiotia hoki nga rohe o Moapa e te karanga; kua tae tona aue ki Ekeraima, tona aue ki Peererimi.
9 Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara, ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn! Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụ tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.
Kei te ki hoki nga wai o Rimono i te toto; tera atu taku e whakapa ai ki Rimona, he raiona ki nga oranga o Moapa, ki nga morehu ano o te whenua.

< Aịzaya 15 >