< Aịzaya 14 >

1 Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
Yehova adzachitira chifundo Yakobo; adzasankhanso Israeli ndi kuwalola kuti akhalenso mʼdziko lawo. Alendo adzabwera kudzakhala nawo ndi kudziphatika okha kukhala ngati a mʼnyumba ya Yakobo.
2 Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
Anthu a mitundu ina adzaperekeza a Israeli ku dziko lawo. Tsono Aisraeli adzasandutsa anthu a mitundu ina aja kukhala antchito awo aamuna ndi aakazi mʼdziko la Yehova. Ndiye kuti Aisraeli adzasandutsa akapolo anthu amene kale anali ambuye awo. Iwo adzasandutsa akapolo anthu amene kale ankawalamulira ndi kuwazunza.
3 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
Yehova akadzakupumitsani ku zowawa ndi mavuto, ndiponso kuntchito yakalavulagaga imene ankakugwiritsani,
4 unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
mudzayankhula monyogodola mfumu ya Babuloni kuti, Wopsinja uja watha! Ukali wake uja watha!
5 Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
Yehova wathyola chikwapu cha anthu oyipa, Iye waphwanya ndodo ya olamulira.
6 nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
Mfumu ya ku Babuloni inkakantha mitundu ya anthu mwaukali powamenya kosalekeza, Iyo inkagonjetsa anthu a mitundu ina mwaukali ndikuwazunza kosalekeza.
7 Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ.
Koma tsopano mayiko onse ali pa mpumulo ndi pa mtendere; ndipo akuyimba mokondwa.
8 Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
Ngakhale mitengo ya payini ndi mikungudza ya ku Lebanoni ikuyimba za iwe mokondwa ndipo ikuti, “Chigwetsedwere chako pansi, palibe wina anabwera kudzatigwetsa.”
9 Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. (Sheol h7585)
Ku manda kwatekeseka kuti akulandire ukamabwera; mizimu ya anthu akufa, aja amene anali atsogoleri a dziko lapansi, yadzutsidwa. Onse amene anali mafumu a mitundu ya anthu ayimiritsidwa pa mipando yawo. (Sheol h7585)
10 Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
Onse adzayankha; adzanena kwa iwe kuti, “Iwenso watheratu mphamvu ngati ife; Iwe wafanana ndi ife.”
11 Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. (Sheol h7585)
Ulemerero wako wonse walowa mʼmanda, pamodzi ndi nyimbo za azeze ako; mphutsi zayalana pogona pako ndipo chofunda chako ndi nyongolotsi. (Sheol h7585)
12 Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
Wagwa pansi bwanji kuchoka kumwamba, iwe nthanda, mwana wa mʼbandakucha! Wagwetsedwa pansi pa dziko lapansi, Iwe amene unagonjetsapo mitundu ya anthu!
13 Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
Mu mtima mwako unkanena kuti, “Ndidzakwera mpaka kumwamba; ndidzakhazika mpando wanga waufumu pamwamba pa nyenyezi za Mulungu; ndidzakhala pa mpando waufumu pa phiri losonkhanirako, pamwamba penipeni pa phiri la kumpoto.
14 Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
Ndidzakwera pamwamba pa mitambo; ndidzafanana ndi Wammwambamwamba.”
15 Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
Koma watsitsidwa mʼmanda pansi penipeni pa dzenje. (Sheol h7585)
16 Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
Anthu akufa adzakupenyetsetsa nadzamalingalira za iwe nʼkumati, “Kodi uyu ndi munthu uja anagwedeza dziko lapansi ndi kunjenjemeretsa maufumu,
17 Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
munthu amene anasandutsa dziko lonse chipululu, amene anagwetsa mizinda yake ndipo sankalola kuti anthu ogwidwa abwerere kwawo?”
18 Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
Mafumu onse a mitundu ya anthu akugona mwaulemu aliyense mʼmanda akeake.
19 Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
Koma iwe watayidwa kunja kwa manda ako, ngati nthambi yowola ndi yonyansa. Mtembo wako waphimbidwa ndi anthu ophedwa; amene anabayidwa ndi lupanga, anatsikira mʼdzenje lamiyala ngati mtembo woponderezedwa.
20 A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
Sudzayikidwa nawo mʼmanda mwaulemu, chifukwa unawononga dziko lako ndi kupha anthu ako. Zidzukulu za anthu oyipa sizidzakumbukika nʼpangʼono pomwe.
21 Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
Konzani malo woti muphere ana ake aamuna chifukwa cha machimo a makolo awo; kuti angadzuke ndi kulanda dziko lapansi ndi kulidzaza dziko lonselo ndi mizinda yawo.
22 Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
Yehova Wamphamvuzonse akuti, “Ine ndidzathira nkhondo mzinda wa Babuloni. Ndidzachotseratu mu Babuloni dzina lake ndi onse otsaliramo. Ndiye kuti sipadzakhala ana kapena zidzukulu,” akutero Yehova.
23 Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Ndidzawusandutsa mzindawo malo okhalamo anungu ndiponso dambo lamatope; ndidzawusesa ndi tsache lowononga,” akutero Yehova Wamphamvuzonse.
24 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
Yehova Wamphamvuzonse walumbira kuti, “Ndithudi, monga ndaganizira ndidzachitadi choncho, ndipo monga momwe ndatsimikizira zidzakhala momwemo ndithu.
25 M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
Ndidzawawononga Asiriya mʼdziko langa; ndidzawapondereza ndi mapazi pa mapiri anga; ndidzachotsa goli lawo pa anthu anga, ndipo ndidzachotsa katundu wawo pa mapewa awo.”
26 Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
Izi ndizo ndakonza kuti zichitike pa dziko lonse lapansi, ndatambasula dzanja pa anthu a mitundu yonse.
27 Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
Pakuti Yehova Wamphamvuzonse watsimikiza, ndipo ndani angamuletse? Dzanja lake latambasulidwa ndipo ndani angalibweze?
28 Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
Uthenga uwu unabwera chaka chimene mfumu Ahazi anamwalira:
29 Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
Musakondwere inu Afilisti nonse kuti Asiriya amene anali ngati ndodo yokukanthani anathedwa; chifukwa kuchokera ku njoka yomweyi (mfumu ya Aasiriya) mudzatuluka mphiri, ndipo chipatso chake chidzakhala njoka yaliwiro ndiponso yaululu.
30 Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.
Osaukitsitsa adzapeza chakudya ndipo amphawi adzakhala mwamtendere. Koma anthu ako ndidzawawononga ndi njala, ndipo njalayo idzapha ngakhale opulumuka ako.
31 Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo! Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia. Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị. Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha.
Lirani kwambiri, anthu a pa chipata! Fuwulani kwambiri, anthu a mu mzinda! Njenjemerani ndi mantha, inu Afilisti nonse! Mtambo wa utsi ukuchokera kumpoto, ndipo palibe wamantha pakati pa ankhondo ake.
32 Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye ndị ozi si na mba ahụ? Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike. Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.
Kodi tidzawayankha chiyani amithenga a ku Filisitiya? “Yehova wakhazikitsa Ziyoni, ndipo mu mzinda wakewu, anthu ozunzika apeza populumukira.”

< Aịzaya 14 >