< Aịzaya 13 >

1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
Brzemię Babilonu, które widział Izajasz, syn Amosa.
2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
Na wysokiej górze wznieście sztandar, podnieście na nich głos, machajcie ręką, aby weszli w bramy książąt.
3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
Ja nakazałem swoim poświęconym, wezwałem też swoich mocarzy [do okazywania] mojego gniewu, tych, którzy radują się z mojego majestatu.
4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
Odgłosy zgrai na górach jakby licznego ludu, odgłosy zgiełku królestw, zgromadzonych narodów. PAN zastępów gromadzi wojsko na wojnę.
5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.
Przybywają z dalekiej ziemi, z krańców nieba, PAN i narzędzia jego zapalczywości, aby spustoszyć całą ziemię.
6 Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
Zawódźcie, bo bliski jest dzień PANA; przyjdzie jak spustoszenie od Wszechmocnego.
7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
Dlatego wszelkie ręce opadną, a każde serce człowieka struchleje.
8 Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
I będą przerażeni: ogarną ich skurcze i boleści, będą wić się z bólu jak rodząca kobieta. Jeden na drugiego spojrzy z osłupieniem, ich twarze będą podobne do płomieni.
9 Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
Oto dzień PANA nadchodzi, okrutny, w zapalczywości i srogim gniewie, aby zamienić tę ziemię w pustynię i wytępić z niej grzeszników.
10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
Gwiazdy nieba bowiem i ich konstelacje nie będą jaśniały swoim światłem. Słońce się zaćmi, gdy tylko wzejdzie, a księżyc nie zabłyśnie swoim światłem.
11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
I ukarzę świat za jego zło i niegodziwych za ich nieprawość; położę kres pysze zuchwałych i poniżę wyniosłość okrutników.
12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
Uczynię człowieka droższym niż czyste złoto, a nawet droższym niż złoto z Ofiru.
13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
Dlatego zatrząsnę niebem, a ziemia ruszy się ze swego miejsca pod zapalczywością PANA zastępów i w dniu jego srogiego gniewu.
14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
I będzie jak spłoszona sarna i jak trzoda, której nikt nie gromadzi: każdy powróci do swego ludu i każdy ucieknie do swojej ziemi.
15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ, onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
Każdy, kogo znajdą, zostanie przebity; a każdy, kto się do nich przyłączy, polegnie od miecza.
16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha; a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
Ich dzieci będą roztrzaskane na ich oczach, ich domy będą splądrowane, a ich żony – zgwałcone.
17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha; ọ dịkwaghị ọlaedo maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
Oto pobudzę przeciwko nim Medów, którzy o srebro nie będą dbać, a w złocie nie będą się lubować.
18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa; ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere, maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
Ich łuki roztrzaskają młodzieńców, nie zlitują się nad płodem łona, ich oko nie przepuści dzieciom.
19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
I Babilon, ozdoba królestw i chluba majestatu Chaldejczyków, stanie się jak Sodoma i Gomora, kiedy Bóg je zniszczył.
20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya. Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
Nie będzie nigdy więcej zamieszkany ani zasiedlony z pokolenia na pokolenie; Arab nie rozbije tam namiotu ani pasterze nie odpoczną tam [z trzodami].
21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara. Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa, na ikwighịkwighị, nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
Ale dziki zwierz pustyni będzie tam odpoczywać, a ich domy będą pełne wyjących bestii; zamieszkają tam sowy, a kozice będą tam podskakiwać.
22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
Straszne bestie wysp będą wyć w ich opuszczonych domach, a smoki w ich wspaniałych pałacach. Jego czas jest bliski, jego dni nie będą przedłużone.

< Aịzaya 13 >