< Aịzaya 12 >

1 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi.
Siku hiyo utasema, ''Nitakushukuru wewe, Yahwe. Japo ulikuwa na hasira na mimi, laana yako imeondoka mbali, na umenifariji mimi,
2 Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Ona Bwana ni wokovu wangu; nitamwamini na sitakuwa na hofu, kwa Yahwe, ndio, Yahwe ni nguvu yangu na wimbo wangu. Amekuwa wokovu wangu.''
3 Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Kwa furaha utachota maji kwenye kisima cha wokovu.
4 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
Siku hiyo utasema, ''Mshukuru Yahwe na ita jina lake; tangaza matendo yake miongoni mwa watu, tangaza jina lake limeinuliwa.
5 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Mwiimbie Yahwe, maana ametenda matendo yaliotukuka; acha hili lijulikane dunia nzima.
6 Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
Lia kwa nguvu na piga kelele kwa furaha, enyi wakazi wa Sayuni, maana katikati yenu ni mtakatifu wa Israeli.

< Aịzaya 12 >