< Aịzaya 12 >

1 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi.
And in that day you shall say, O LORD, I will praise you: though you were angry with me, your anger is turned away, and you comforted me.
2 Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Behold, God is my salvation; I will trust, and not be afraid: for the LORD JEHOVAH is my strength and my song; he also is become my salvation.
3 Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Therefore with joy shall you draw water out of the wells of salvation.
4 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
And in that day shall you say, Praise the LORD, call on his name, declare his doings among the people, make mention that his name is exalted.
5 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Sing to the LORD; for he has done excellent things: this is known in all the earth.
6 Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
Cry out and shout, you inhabitant of Zion: for great is the Holy One of Israel in the middle of you.

< Aịzaya 12 >