< Aịzaya 11 >

1 Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
Miti itachipukia katika mizizi ya Yese, na matawi yanayotokana na mizizi yatazaa matunda.
2 Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
Na roho wa Bwana atashuka juu yake, roho wa hekima na maelewano, roho ya maelekezo na ukuu, roho ya maarifa na hofu ya Yahwe.
3 Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
Furaha yake itakuwa hofu ya Bwana; hatatoa hukumu kwa kile anachokiona, wala atatoa maamuzi kwa kile anachokisikia.
4 Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
Badala yake atawahukumu masikini kwa haki na atafanya maamuzi kwa usawa na unyenyekevu. Ataamurisha mgomo wa dunia kwa fimbo ya mdomo wake, na punzi ya midomo yake, atawauwa waovu.
5 Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
Haki itakuwa mkanda wa viuno kiuno chake kuzunguka mapaja yake.
6 Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
Mbwa mwitu atakaa pamoja na kondoo, na chui watalala chini pamoja na mtoto wa mbuzi, ndama, mtoto wa simba na ndama pamoja na ndama aliyenona. Mtoto mdogo atawaongoza wao.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
Ng'ombe na dubu watachungwa pamoja. Na watoto wao watalala pamoja. Simba atakula majani kama ng'ombe.
8 Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
Mtoto atacheza juu ya chimo la nyoka, na mtoto aliyeachwa ataweka mkono wake katika pango la nyoka.
9 Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
Hawataumizwa wala kuharibiwa kwenye mlima mtakatifu; kwa maana dunia itakuwa imejaa maarifa ya Yahwe, kama maji yajaavyo kwenye bahari.
10 Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Siku hiyo mzizi wa Yese utasimama kama bendera ya watu. Taifa litamtafuta yeye nje, na mahali pake pakupumzikia patatukuka.
11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
Siku hiyo, Bwana ataunyoosha mkono wake tena kuokoa mabaki ya watu wake yaliyosalia huko Asiria, Misri, Pathrosi, Kushi, Shinari, Hamathi, na kisiwa cha bahari.
12 Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
Ataweka bendera kwa kwa mataifa na atakusanya Waisrel waliotupwa na watu wa Juuda waliotawanyika kitika pembe nne za dunia.
13 Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
Ataujeuza wivu wa Efraimu, na ukatili wa Yuda utakomeshwa. Efraimu atamuonea wivu Yuda, Yuda hatakuwa adui wa Efraimu tena.
14 Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
Badala yake, watashuka chini kwenye mlima wa Wafilisti upande wa magharibi, na pamoja watateka watu mashariki. Watavamia Edomu na Moabu, na watu wa Amoni watawatii wao.
15 Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
Yahwe atauharibu kabisa ghuba ya bahari ya Misri. Kwa mawimbi makali ambayo yanavuma juu ya mtoto Efurate na itagawanyika katika mifereji saba, hivyo unaweza ukapita juu kwa viatu.
16 Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
Kutakuwa na njia kuu kwa ajili ya mabaki ya watu kurudi kutoka Asiria, maana kuna Waisraeli wanaokuja kutoka nchi ya Misri.

< Aịzaya 11 >