< Aịzaya 10 >

1 Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
Maye kwabamisa izimiso ezikhohlakeleyo, lakubabhali ababhala uhlupho;
2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
ukuphambula abayanga ekwahlulelweni, lokuphanga ilungelo labahluphekayo babantu bami, ukuze abafelokazi babe yimpango yabo lokuthi baphange izintandane!
3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?
Kodwa lizakwenzani ngosuku lwempindiselo, lencithakalweni ezavela khatshana? Lizabalekela kubani ukuthi libe losizo? Lizatshiya ngaphi udumo lwenu?
4 Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Ngaphandle kwami bazakhothama ngaphansi kwezibotshwa, liwele ngaphansi kwababuleweyo. Kukho konke lokhu intukuthelo yayo kayiphenduki, kodwa isandla sayo silokhu seluliwe.
5 “Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.
Maye kumAsiriya, intonga yentukuthelo yami, lolaka lwami luyinduku esandleni sabo!
6 Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
Ngizamthumela isizwe esizenzisayo, ngizamlaya ukumelana labantu bolaka lwami, ukuphanga impango, lokuthumba okuthunjiweyo, lokukubeka kube ngokunyathelwayo njengodaka lwezitalada.
7 Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
Kodwa yena kanakani njalo, lenhliziyo yakhe kayicabangi njalo; kodwa kusenhliziyweni yakhe ukuchitha, lokuquma izizwe ezingenlutshwana.
8 Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
Ngoba uthi: Iziphathamandla zami zonke kazisimakhosi yini?
9 ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
IKalino kayinjengeKarikemishi yini? IHamathi kayinjengeArpadi yini? ISamariya kayinjengeDamaseko yini?
10 Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
Njengoba isandla sami sithole imibuso yezithombe, ozithombe zayo ezibaziweyo zingcono kulezeJerusalema lakulezeSamariya;
11 Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’”
njengalokhu ngenzile kuyo iSamariya lezithombe zayo, kangiyikwenza njalo yini kuyo iJerusalema lezithombe zayo?
12 Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
Kuzakuthi-ke lapho iNkosi isiqedile umsebenzi wayo wonke entabeni yeZiyoni laseJerusalema, ngiphindisele isithelo sokuzikhukhumeza kwenhliziyo yenkosi yeAsiriya lobuhle bokuziqhenya kwamehlo ayo.
13 Nʼihi na ọ na-asị, “‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
Ngoba ithe: Ngamandla esandla sami ngikwenzile, langenhlakanipho yami, ngoba ngiyaqedisisa; njalo ngisusile imikhawulo yezizwe, ngaphanga inotho yazo; lanjengeqhawe ngehlisela phansi abahlali bazo.
14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’”
Isandla sami sesithole inotho yezizwe njengesidleke; lanjengobuthelela amaqanda atshiyiweyo, mina ngibuthelele umhlaba wonke; njalo kwakungekho ophaphazelisa impiko, kumbe ovula umlomo, kumbe otshiyozayo.
15 Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
Ihloka lizazikhukhumeza kuye ogamula ngalo yini? Isaha izazikhulisa kuye oyinyikinyayo yini? Njengokungathi induku ingaziphakamisa, kungathi kayisisigodo.
16 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
Ngalokhu iNkosi uJehova wamabandla izathumela ukucaka phakathi kwabazimukileyo bayo; langaphansi kodumo lwayo izaphemba ukutshisa njengokutshisa komlilo.
17 Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
Lokukhanya kukaIsrayeli kuzakuba ngumlilo, loNgcwele wakhe abe lilangabi, elizatshisa liqede ameva ayo lokhula lwayo oluhlabayo ngasuku lunye.
18 A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
Liqede lodumo lwehlathi lwayo, lensimu yayo ethelayo, kusukela emphefumulweni kusiya enyameni, ibe njengokuphela kwamandla womthwalifulegi.
19 Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
Lokuseleyo kwezihlahla zehlathi zayo kuzakuba nlutshwana ngenani, ukuze umntwana akubale.
20 Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
Kuzakuthi-ke ngalolosuku insali yakoIsrayeli labaphunyukileyo bendlu kaJakobe kabasayikuqhubeka ukweyama kobatshayileyo; kodwa bazakweyama eNkosini, oNgcwele kaIsrayeli, ngeqiniso.
21 Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
Insali izabuyela, insali kaJakobe, kuNkulunkulu olamandla.
22 Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
Ngoba lanxa abantu bakho, Israyeli, bengangetshebetshebe lolwandle, kube kanti insali yabo izabuya; ukuchitheka kumisiwe, kuphuphuma ngokulunga.
23 E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
Ngoba ukubhujiswa okupheleleyo okumisiweyo iNkosi uJehova wamabandla izakwenza phakathi komhlaba wonke.
24 Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova wamabandla: Bantu bami, elihlala eZiyoni, lingesabi iAsiriya lapho ilitshaya ngenduku, iliphakamisela intonga yayo njengendlela yamaGibhithe.
25 Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
Ngoba kuseyisikhatshana nje ukuthukuthela kuzaphela, lolaka lwami ekuchithweni kwabo.
26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
Njalo iNkosi yamabandla izabavusela isiswepu, njengokuhlatshwa kweMidiyani edwaleni leOrebi; lanjengentonga yayo phezu kolwandle ezayiphakamisa njengendlela yeGibhithe.
27 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu.
Kuzakuthi-ke ngalolosuku umthwalo wayo usuke ehlombe lakho, lejogwe layo entanyeni yakho, lejogwe lizakwephulwa ngenxa yokugcotshwa.
28 Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
Uyeza eAyathi, udabula phakathi kweMigironi; eMikimashi wethula impahla yakhe.
29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
Badlula esikhaleni, ebusuku bayalala eGeba; iRama iyathuthumela; iGibeya kaSawuli iyabaleka.
30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
Hlaba umkhosi ngelizwi lakho, ndodakazi kaGalimi! Lizwakalise eLayishi, Anathothi elusizana!
31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.
IMadimena iyabaleka, abahlali beGebimi badinga isiphephelo.
32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
Kuselamuhla uzakuma eNobi, anyikinye isandla sakhe emelene lentaba yendodakazi yeZiyoni, uqaqa lweJerusalema.
33 Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
Khangela, iNkosi uJehova wamabandla izaquma ingatsha ngamandla esabekayo, lalabo abaphakeme ngobude bazaganyulelwa phansi, labazikhukhumezayo bazathotshiswa.
34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.
Njalo izagamula izixuku zehlathi ngensimbi, leLebhanoni izakuwa ngolamandla.

< Aịzaya 10 >