< Aịzaya 10 >
1 Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
Woe to those who enact unjust laws and write unfair decrees.
2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
They deprive the needy of justice, rob the poor of my people of their rights, plunder widows, and make the fatherless their prey!
3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?
What will you do on judgment day when the destruction comes from far away? To whom will you flee for help, and where will you leave your wealth?
4 Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Nothing remains, and you crouch among the prisoners or fall among the killed. In all these things, his anger does not subside; instead, his hand is still stretched out.
5 “Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.
Woe to the Assyrian, the club of my anger, the rod by whom I wield my fury!
6 Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
I send him against an arrogant nation and against the people who bear my overflowing wrath. I order him to take the spoil, to take the prey, and to trample them like mud in the streets.
7 Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
But this is not what he intends, nor does he think this way. It is in his heart to destroy and eliminate many nations.
8 Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
For he says, “Are not all my princes kings?
9 ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
Is not Kalno like Carchemish? Is not Hamath like Arpad? Is not Samaria like Damascus?
10 Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
As my hand has overcome idolatrous kingdoms, whose carved figures were greater than those of Jerusalem and Samaria,
11 Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’”
just as I did to Samaria and her worthless idols, will I not also do the same to Jerusalem and to her idols?”
12 Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
When the Lord has finished his work on Mount Zion and on Jerusalem, I will punish the speech of the arrogant heart of the king of Assyria and his prideful looks.
13 Nʼihi na ọ na-asị, “‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
For he says, “By my strength and by my wisdom I acted. I have understanding, and I have removed the boundaries of the peoples. I have stolen their treasures, and like a bull I have brought down the inhabitants.
14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’”
My hand has seized, as from a nest, the wealth of nations, and as one gathers abandoned eggs, I gathered all the earth. None fluttered their wings or opened their mouth or chirped.”
15 Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
Will the ax boast about itself against the one who wields it? Will the saw praise itself more than the one who cuts with it? It is as if a rod could lift up those who raise it, or as if a wooden club could lift up a person.
16 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
Therefore the Lord Yahweh of hosts will send emaciation among his elite warriors; and under his glory there will be kindled a burning like fire.
17 Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
The light of Israel will become a fire, and his Holy One a flame; it will burn and devour his thorns and briers in one day.
18 A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
Yahweh will consume the glory of his forest and of his fruitful land, both soul and body; it will be like when a sick man's life wastes away.
19 Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
The remnant of the trees of his forest will be so few, that a child could count them.
20 Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
On that day, the remnant of Israel, the family of Jacob that has escaped, will no longer rely on the one who defeated them, but will indeed depend on Yahweh, the Holy One of Israel.
21 Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
A remnant of Jacob will return to the mighty God.
22 Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
For though your people, Israel, are like the sand of the seashore, only a remnant of them will return. Destruction is decreed, as overflowing righteousness demands.
23 E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
For the Lord Yahweh of hosts, is about to carry out the destruction determined throughout the land.
24 Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
Therefore the Lord Yahweh of hosts says, “My people who live in Zion, do not fear the Assyrian. He will strike you with the rod and raise his staff against you, as the Egyptians did.
25 Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
Do not fear him, for in a very short time my anger against you will end, and my anger will lead to his destruction.”
26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
Then Yahweh of hosts will wield a whip against them, as when he defeated Midian at the rock of Oreb. He will raise his rod over the sea and lift it up as he did in Egypt.
27 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu.
On that day, his burden is lifted from your shoulder and his yoke from off your neck, and the yoke will be destroyed because of fatness.
28 Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
The enemy has come to Aiath and has passed through Migron; at Michmash he has stored his provisions.
29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
They have crossed over the pass and they lodge at Geba. Ramah trembles and Gibeah of Saul has fled.
30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
Cry aloud, daughter of Gallim! Give attention, Laishah! You poor Anathoth!
31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.
Madmenah is fleeing, and the inhabitants of Gebim run for safety.
32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
This very day he will halt at Nob and shake his fist at the mountain of the daughter of Zion, the hill of Jerusalem.
33 Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
Behold, the Lord Yahweh of hosts will lop off the boughs with a terrifying crash; the tallest trees will be cut down, and the lofty will be brought low.
34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.
He will chop down the thickets of the forest with an ax, and Lebanon in his majesty will fall.