< Hosiya 9 >

1 Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.
Isalaele, kosepela te; kozala na esengo te lokola bikolo mosusu; pamba te otikaki Nzambe na yo mpe okendeki kosala kindumba; osepelaki na lifuti ya kindumba na bitando nyonso oyo batutelaka ble.
2 Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
Etando oyo batutelaka ble mpe ekamolelo masanga ya vino ekopesa bango bilei te, mpe bakozanga vino ya sika.
3 Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
Bakovanda lisusu te na mboka na Yawe; Efrayimi akozonga na Ejipito, mpe bakolia bilei ya mbindo kati na Asiri.
4 Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Bakobonzela lisusu Yawe makabo ya masanga ya vino te, mpe bambeka na bango ekosepelisa lisusu Yawe te. Ekozala mpo na bango lokola bilei ya matanga: bato nyonso oyo bakolia yango bakokoma mbindo; pamba te bilei na bango ekozala kaka mpo na mabumu na bango, kasi ekokota te na Tempelo ya Yawe.
5 Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
Boye, bokosala nini na mikolo ya bafeti oyo ekatama, na mikolo ya bafeti ya Yawe?
6 A sịkwa na ha agbanarị mbibi, ndị Ijipt ga-achịkọta ha. Ndị Memfis ga-elikwa ha. Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,
Ata soki bakimi, bakobebisama; Ejipito ekoyamba bango, Mefisi ekozala kunda na bango; matiti mabe ekotonda na bibombelo palata na bango, banzube ekotonda kati na bandako na bango.
7 Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
Mikolo ya etumbu ezali koya, mikolo ya kofuta masumu esili koya. Isalaele, yeba yango! Mosakoli akomi zoba, moto ya Molimo abeli liboma! Pamba te masumu na yo ekomi ebele penza, mpe mabe na yo ekomi mingi liboso na ngai.
8 Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.
Mokengeli ya Efrayimi azali elongo na Nzambe na ngai, azali mosakoli; Nzokande bazali kotiela ye mitambo na banzela na ye nyonso mpe bazali kotelemela ye kino na Ndako ya Nzambe na ye.
9 Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. Ọ ga-echeta njehie ha. Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
Bamikotisi penza kati na mabe ndenge basalaki na mikolo ya Gibea. Nzambe akobosana mabe na bango te mpe akopesa bango etumbu mpo na masumu na bango.
10 “Mgbe m chọtara Izrel, ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; mgbe m hụrụ nna nna unu ha, ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
Tango namonaki Isalaele, azalaki lokola bambuma ya vino kati na esobe. Tango namonaki bakoko na bino, bazalaki lokola bambuma ya liboso ya nzete ya figi. Kasi tango bakomaki na Bala Peori, bamipesaki na nzambe oyo ya ekeko ya soni mpe bakomaki nkele lokola eloko oyo bango balingaki.
11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
Nkembo ya Efrayimi ekokima lokola ndeke, wuta na mbotama, wuta na zemi, wuta na ebandeli ya zemi.
12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
Ezala soki babokoli bana, nakobotola bango liboso ete bakola. Solo, mawa na bango tango nakopesa bango mokongo!
13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
Nazali komona Efrayimi lokola engumba Tiri oyo etongama na likolo ya mabele ya kitoko; nzokande, Efrayimi akokaba bana na ye na mobomi.
14 Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
Oh Yawe, pesa bango… Okopesa bango nini? Pesa bango mabumu oyo esopaka bazemi, mpe mabele oyo ekawuka.
15 “Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
Nayinaki bango mpo na mabe na bango nyonso oyo basalaki na Giligali; Nakobengana bango na Ndako na Ngai mpo na misala na bango ya mabe. Nakolinga bango lisusu te, pamba te bakonzi na bango nyonso bazali batomboki.
16 Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
Efrayimi alembi, misisa na ye ekawuki; akobota lisusu bambuma te; ata soki baboti bana, nakoboma bana na bango oyo balingaka mingi.
17 Chineke m ga-ajụ ha, nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.
Nzambe na ngai akobwaka bango, pamba te batosaki Ye te, mpe bakokoma koyengayenga kati na bikolo.

< Hosiya 9 >