< Hosiya 8 >

1 “Tinye opi ike nʼọnụ gị! Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị, nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m, nupu isi megide iwu m.
Let there be a trumpet in thy throat like an eagle upon the house of the Lord: because they have transgressed my covenant, and have violated my law.
2 Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa, ‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’
They shall call upon me: O my God, we, Israel, know thee.
3 Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.
Israel hath cast off the thing that is good, the enemy shall pursue him.
4 Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha.
They have reigned, but not by me: they have been princes, and I knew not: of their silver, and their gold they have made idols to themselves, that they might perish.
5 Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
Thy calf, O Samaria, is cast off, my wrath is kindled against them. How long will they be incapable of being cleansed?
6 Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
For itself also is the invention of Israel: a workman made it, and it is no god: for the calf of Samaria shall be turned to spiders’ webs.
7 “Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
For they shall sow wind, and reap a whirlwind, there is no standing stalk in it, the bud shall yield no meal; and if it should yield, strangers shall eat it.
8 Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite.
Israel is swallowed up: now is he become among the nations like an unclean vessel.
9 Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
For they are gone up to Assyria, a wild ass alone by himself: Ephraim hath given gifts to his lovers.
10 Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.
But even though they shall have hired the nations, now will I gather them together: and they shall rest a while from the burden of the king, and the princes.
11 “Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.
Because Ephraim hath made many altars to sin: altars are become to him unto sin.
12 E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.
I shall write to him my manifold laws, which have been accounted as foreign.
13 Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.
They shall offer victims, they shall sacrifice flesh, and shall eat it, and the Lord will not receive them: now will he remember their iniquity, and will visit their sins: they shall return to Egypt.
14 Izrel echezọọla Onye kere ha ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”
And Israel hath forgotten his Maker, and hath built temples: and Juda hath built many fenced cities: and I will send a fire upon his cities, and it shall devour the houses thereof.

< Hosiya 8 >