< Hosiya 7 >
1 mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
a duka sa’ad da zan warkar da Isra’ila, zunuban Efraim za su tonu za a kuma bayyana laifofin Samariya. Suna ruɗu, ɓarayi sukan fasa su shiga gidaje,’yan fashi sukan yi fashi a tituna;
2 Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
amma ba su gane cewa na tuna da dukan ayyukan muguntarsu ba. Zunubansu sun kewaye su; kullum suna a gabana.
3 “Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
“Suna faranta wa sarki zuciya da muguntarsu, shugabanni kuma da ƙarairayinsu.
4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
Dukansu mazinata ne suna ƙuna kamar matoya wadda mai gashin burodi ba ya bukata yă tura mata wuta daga cuɗe kullu har kumburinsa.
5 Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
A ranar bikin sarkinmu shugabanni sukan bugu da ruwan inabi, yă yi cuɗanya da masu ba’a.
6 Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
Zukatansu suna kamar matoya; sukan kusace shi da wayo. Muguwar aniyarsu takan yi ta ci dukan dare; da safe sai ta ƙuna kamar harshen wuta.
7 Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
Dukansu suna da zafi kamar matoya; suna kashe masu mulkinsu. Dukan sarakunansu sukan fāɗi, kuma babu waninsu da yake kira gare ni.
8 “Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
“Efraim yana cuɗanya da al’ummai; Efraim waina ne mai fāɗi da ba a juye ba.
9 Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
Baƙi sun tsotse ƙarfinsa, amma bai gane ba. Gashi kansa ya cika da furfura, amma bai lura ba.
10 Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
Girmankan Isra’ila ya ba da shaida a kansa, amma duk da haka bai dawo ga Ubangiji Allahnsa ko yă neme shi ba.
11 “Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
“Efraim yana kama da kurciya, marar wayo, marar hankali, yanzu yana kira ga Masar, yanzu yana juyewa ga Assuriya.
12 Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
Sa’ad da suka tafi, zan jefa ragata a kansu; zai janye su ƙasa kamar tsuntsayen sararin sama. Sa’ad da na ji suna tafiya tare, zan kama su.
13 Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
Kaitonsu, domin sun kauce daga gare ni! Hallaka za tă aukar musu, domin sun tayar mini! Na ƙudura in cece su amma suna faɗar ƙarya a kaina.
14 Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
Ba sa yin mini kuka da zuciyarsu amma suna ihu a kan gadajensu. Sukan taru wurin ɗaya don hatsi da ruwan inabi amma su juya mini baya.
15 Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
Na horar da su na kuma ƙarfafa su, amma sun ƙulla mini maƙarƙashiya.
16 Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.
Ba sa juya ga Mafi Ɗaukaka; suna kama da tanƙwararren baka. Za a kashe shugabanninsu da takobi saboda banzan maganganunsu. Saboda wannan za a wulaƙanta su a ƙasar Masar.