< Hosiya 7 >
1 mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
When my desire was for the fate of my people to be changed and to make Israel well, then the sin of Ephraim was made clear, and the evil-doing of Samaria; for their ways are false, and the thief comes into the house, while the band of outlaws takes property by force in the streets.
2 Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
And they do not say to themselves that I keep in mind all their sin; now their evil acts come round them on every side; they are before my face.
3 “Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
In their sin they make a king for themselves, and rulers in their deceit.
4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
They are all untrue; they are like a burning oven; the bread-maker does not make up the fire from the time when the paste is mixed till it is leavened.
5 Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
On the day of our king, the rulers made him ill with the heat of wine; his hand was stretched out with the men of pride.
6 Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
For they have made their hearts ready like an oven, while they are waiting secretly; their wrath is sleeping all night; in the morning it is burning like a flaming fire.
7 Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
They are all heated like an oven, and they put an end to their judges; all their kings have been made low; not one among them makes prayer to me.
8 “Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
Ephraim is mixed with the peoples; Ephraim is a cake not turned.
9 Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
Men from other lands have made waste his strength, and he is not conscious of it; grey hairs have come on him here and there, and he has no knowledge of it.
10 Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
And the pride of Israel gives an answer to his face; but for all this, they have not gone back to the Lord their God, or made search for him.
11 “Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
And Ephraim is like a foolish dove, without wisdom; they send out their cry to Egypt, they go to Assyria.
12 Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
When they go, my net will be stretched out over them; I will take them like the birds of heaven, I will give them punishment, I will take them away in the net for their sin.
13 Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
May trouble be theirs! for they have gone far away from me; and destruction, for they have been sinning against me; I was ready to be their saviour, but they said false words against me.
14 Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
And they have not made prayer to me in their hearts, but they make loud cries on their beds; they are cutting themselves for food and wine, they are turned against me.
15 Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
Though I have given training and strength to their arms, they have evil designs against me.
16 Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.
They have gone to what is of no value; they are like a false bow; their captains will come to destruction by the sword, and their ruler by my wrath; for this, the land of Egypt will make sport of them.