< Hosiya 6 >

1 “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.
「さあ、わたしたちは主に帰ろう。主はわたしたちをかき裂かれたが、またいやし、わたしたちを打たれたが、また包んでくださるからだ。
2 Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
主は、ふつかの後、わたしたちを生かし、三日目にわたしたちを立たせられる。わたしたちはみ前で生きる。
3 Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
わたしたちは主を知ろう、せつに主を知ることを求めよう。主はあしたの光のように必ず現れいで、冬の雨のように、わたしたちに臨み、春の雨のように地を潤される」。
4 “Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
エフライムよ、わたしはあなたに何をしようか。ユダよ、わたしはあなたに何をしようか。あなたがたの愛はあしたの雲のごとく、また、たちまち消える露のようなものである。
5 Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
それゆえ、わたしは預言者たちによって彼らを切り倒し、わが口の言葉をもって彼らを殺した。わがさばきは現れ出る光のようだ。
6 Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
わたしはいつくしみを喜び、犠牲を喜ばない。燔祭よりもむしろ神を知ることを喜ぶ。
7 Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m; nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
ところが彼らはアダムで契約を破り、かしこでわたしにそむいた。
8 Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe, nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.
ギレアデは悪を行う者の町で、血の足跡で満たされている。
9 Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.
盗賊が人を待ち伏せするように、祭司たちは党を組み、シケムへ行く道で人を殺す。このように彼らは悪しき事を行う。
10 Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel. Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna, emerụọkwala Izrel.
わたしはイスラエルの家に恐るべき事を見た。かしこでエフライムは淫行をなし、イスラエルは汚された。
11 “Ma nye gị onwe gị, Juda, owuwe ihe ubi nọ na-eche gị. “Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,
ユダよ、あなたのためにも刈入れが定められている。わたしがわが民の繁栄を回復するとき、

< Hosiya 6 >