< Hosiya 6 >

1 “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.
“Bwerani, tiyeni tibwerere kwa Yehova. Iye watikhadzula, koma adzatichiritsa. Iye wativulaza, koma adzamanga mabala athu.
2 Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
Pakapita masiku awiri adzatitsitsimutsa; pa tsiku lachitatu Iye adzatiukitsa kuti tikhale ndi moyo pamaso pake.
3 Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
Tiyeni timudziwe Yehova, tiyeni tilimbike kumudziwa Iye. Adzabwera kwa ife mosakayikira konse ngati kutuluka kwa dzuwa; adzabwera kwa ife ngati mvula ya mʼchilimwe, ngati mvula ya nthawi yamphukira imene imakhathamiritsa nthaka.”
4 “Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
Iwe Efereimu, kodi ndichite nawe chiyani? Kodi ndichite nawe chiyani, iwe Yuda? Chikondi chanu chili ngati nkhungu yammawa, ngati mame a mmamawa amene amakamuka msanga.
5 Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
Choncho ndakuwazani ngati nkhuni kudzera mwa aneneri anga, ndakuphani ndi mawu a pakamwa panga; chigamulo changa chinangʼanima ngati mphenzi pa inu.
6 Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
Pakuti Ine ndimafuna chifundo osati nsembe, ndi kudziwa Mulungu kulekana ndi nsembe zopsereza.
7 Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m; nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
Monga Adamu, anthuwa aphwanya pangano langa, iwo sanakhulupirike kwa Ine.
8 Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe, nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.
Giliyadi ndi mzinda wa anthu ochita zoyipa, okhala ndi zizindikiro za kuphana.
9 Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.
Monga momwe mbala zimadikirira anthu, magulu a ansembe amachitanso motero; iwo amapha anthu pa njira yopita ku Sekemu, kupalamula milandu yochititsa manyazi.
10 Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel. Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna, emerụọkwala Izrel.
Ndaona chinthu choopsa kwambiri mʼnyumba ya Israeli. Kumeneko Efereimu akuchita zachiwerewere, ndipo Israeli wadzidetsa.
11 “Ma nye gị onwe gị, Juda, owuwe ihe ubi nọ na-eche gị. “Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,
“Kunenanso za iwe Yuda, udzakolola chilango. “Pamene ndiwabwezere anthu anga zinthu zabwino.”

< Hosiya 6 >