< Hosiya 5 >

1 “Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.
“Sikieni hili, enyi makuhani! Kuweni wasikivu, enyi Waisraeli! Sikieni, ee nyumba ya mfalme! Hukumu hii ni dhidi yenu: Mmekuwa mtego huko Mispa, wavu uliotandwa juu ya Tabori.
2 Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.
Waasi wamezidisha sana mauaji. Mimi nitawatiisha wote.
3 Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị.
Ninajua yote kuhusu Efraimu, Israeli hukufichika kwangu. Efraimu, sasa umegeukia ukahaba, Israeli amenajisika.
4 “Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa Onyenwe anyị.
“Matendo yao hayawaachii kurudi kwa Mungu wao. Roho ya ukahaba imo ndani ya mioyo yao, hawamkubali Bwana.
5 Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.
Kiburi cha Israeli kinashuhudia dhidi yao; Waisraeli, hata Efraimu, wanajikwaa katika dhambi zao; pia Yuda atajikwaa pamoja nao.
6 Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.
Wakati wanapokwenda na makundi yao ya kondoo na ngʼombe kumtafuta Bwana, hawatampata; yeye amejiondoa kutoka kwao.
7 Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha.
Wao si waaminifu kwa Bwana; wamezaa watoto haramu. Sasa sikukuu zao za Mwandamo wa Mwezi zitawaangamiza wao pamoja na mashamba yao.
8 “Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.
“Pigeni tarumbeta huko Gibea, baragumu huko Rama. Paza kilio cha vita huko Beth-Aveni, ongoza, ee Benyamini.
9 A ga-ebibi Ifrem kpamkpam nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ. Nʼetiti ebo nke Izrel niile, ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.
Efraimu ataachwa ukiwa katika siku ya kuadhibiwa. Miongoni mwa makabila ya Israeli ninatangaza lile ambalo halina budi kutukia.
10 Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo.
Viongozi wa Yuda ni kama wale wanaosogeza mawe ya mpaka. Nitamwaga ghadhabu yangu juu yao kama mafuriko ya maji.
11 Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.
Efraimu ameonewa, amekanyagwa katika hukumu kwa kuwa amekusudia kufuatia sanamu.
12 Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.
Mimi ni kama nondo kwa Efraimu, na kama uozo kwa watu wa Yuda.
13 “Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile.
“Wakati Efraimu alipoona ugonjwa wake, naye Yuda vidonda vyake, ndipo Efraimu alipogeukia Ashuru, na kuomba msaada kwa mfalme mkuu. Lakini hawezi kukuponya, wala hawezi kukuponya vidonda vyako.
14 Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.
Kwa maana nitakuwa kama simba kwa Efraimu, kama simba mkubwa kwa Yuda. Nitawararua vipande vipande na kuondoka; nitawachukua mbali, na hakuna wa kuwaokoa.
15 Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, ma chọọ ihu m; nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, ha ga-achọsi m ike.”
Kisha nitarudi mahali pangu mpaka watakapokubali kosa lao. Nao watautafuta uso wangu; katika taabu yao watanitafuta kwa bidii.”

< Hosiya 5 >