< Hosiya 4 >

1 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
Zwanini ilizwi leNkosi, bantwana bakoIsrayeli, ngoba iNkosi ilempikisano labahlali belizwe; ngoba kakulaqiniso, njalo kakulamusa, njalo kakulalwazi lukaNkulunkulu elizweni.
2 Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
Kulokufunga, lokuqamba amanga, lokubulala, lokweba, lokufeba; bayafohla, lamacala egazi athinta amacala egazi.
3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.
Ngenxa yalokho ilizwe lizalila, laye wonke ohlala kilo udangele, kanye lenyamazana zeganga, njalo kanye lenyoni zamazulu; yebo lenhlanzi zolwandle zizasuswa.
4 “Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
Kodwa kakungabi khona umuntu ophikisayo, kangasoli omunye; ngoba abantu bakho banjengabaphikisana lompristi.
5 Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
Ngakho uzakhubeka emini, yebo, lomprofethi uzakhubeka kanye lawe ebusuku; njalo ngizamchitha unyoko.
6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
Abantu bami babhujisiwe ngokuswela ulwazi; ngoba wena ulwalile ulwazi, lami ngizakwala, ukuze ungangisebenzeli njengompristi. Lokhu usuwukhohliwe umlayo kaNkulunkulu wakho, lami ngizakhohlwa abantwana bakho.
7 Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
Njengokwanda kwabo ngokunjalo bonile kimi. Udumo lwabo ngizaluphendula lube lihlazo.
8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
Badla isono sabantu bami, baphakamisela umphefumulo wabo esiphambekweni sabo.
9 Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
Kuzakuthi-ke njengabantu abe njalo umpristi; ngizajezisa izindlela zabo phezu kwabo, ngiphindisele izenzo zabo kubo.
10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee
Ngoba bazakudla, kodwa bangasuthi; bawule, kodwa bangandi; ngoba bayekele ukuqaphela iNkosi.
11 nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
Ubuwule lewayini lewayini elitsha kususa inhliziyo.
12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
Abantu bami babuza esigodweni sabo, lentonga yabo izabatshela. Ngoba umoya wokuwula ubaduhisile, ukuze bawule besuka phansi kukaNkulunkulu wabo.
13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
Benza imihlatshelo engqongeni zezintaba, batshisa impepha phezu kwamaqaqa, ngaphansi kwesihlahla se-okhi, lephophula, lesihlahla esikhulu, ngoba umthunzi waso muhle. Ngenxa yalokho amadodakazi enu azawula, labomakoti benu bazafeba.
14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
Kangiyikuwajezisa amadodakazi enu lapho ewula, labomakoti benu lapho befeba; ngoba bona ngokwabo bazehlukanisa lamawule, basebesenza imihlatshelo kanye lezifebe zethempeli; ngakho abantu abangelakuqedisisa bazawiselwa phansi.
15 “Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
Loba wena Israyeli uwula, uJuda kangabi lacala. Lingangeni-ke eGiligali, lingenyukeli eBeti-Aveni, lingafungilithi: Kuphila kukaJehova.
16 Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
Ngoba uIsrayeli ujila njengejongosi eliyisiqholo; khathesi iNkosi izabelusa njengewundlu endaweni ebanzi.
17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
UEfrayimi uhlangene lezithombe; myekele.
18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
Okunathwayo kwabo okulamandla kusukile, bazinikela ekuwuleni, ababavikelayo bathanda ngokuthanda ihlazo.
19 Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
Umoya ubabophele empikweni zawo, njalo bazakuba lenhloni ngenxa yemihlatshelo yabo.

< Hosiya 4 >