< Hosiya 3 >
1 Onyenwe anyị gwara m ọzọ, “Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee.”
Bwana akaniambia, “Nenda, ukaonyeshe upendo wako kwa mke wako tena, ingawa amependwa na mwingine naye ni mzinzi. Mpende kama Bwana apendavyo Waisraeli, ingawa wanageukia miungu mingine na kupenda mikate mitamu ya zabibu kavu iliyowekwa wakfu.”
2 Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya.
Basi nilimnunua huyo mwanamke kwa shekeli kumi na tano za fedha, pia kwa kiasi kama cha homeri moja na nusu ya shayiri.
3 Mgbe ahụ agwara m ya, “Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, ị gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe ị nọ.”
Kisha nilimwambia, “Utaishi nami kwa siku nyingi, hupaswi kuwa kahaba au kuwa na uhusiano wa karibu na mtu yeyote, nami nitaishi na wewe.”
4 Nke a na-egosi na Izrel ga-anọ ogologo mgbe na-enweghị eze maọbụ onye ọchịchị. Ọ gaghị enwe ịchụ aja maọbụ nkume nsọ maọbụ efọọd maọbụ arụsị ezinaụlọ.
Kwa maana Waisraeli wataishi siku nyingi bila kuwa na mfalme wala mkuu, bila kuwa na dhabihu wala mawe matakatifu, bila kisibau wala sanamu.
5 Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.
Baadaye Waisraeli watarudi na kumtafuta Bwana Mungu wao na Daudi mfalme wao. Watakuja wakitetemeka kwa Bwana na kwa baraka zake katika siku za mwisho.