< Hosiya 2 >
1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
Ke ma inge, pangon mukul Israel wiowos “Ammi,” ac mutan Israel wiowos, “Ruhamah.”.
2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
Tulik nutik, fahla nu yurin nina kiomtal, el finne tila mutan se kiuk ac nga tila mukul tumal. Fahla kwafe sel elan tui liki elahn kosro lal ac moul fohkfok lal.
3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
El fin tiana tui, nga fah selya elan koflufolla oana ke len se el isusla ah. Nga fah oru elan oana sie acn musrasrla ac el fah misa ke malu.
4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Nga fah tia pakomuta tulik natul, mweyen elos tulik nutin sie mutan kosro.
5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
Mutan sac el sifacna fahk mu, “Nga ac som nu yurin mukul nga orek pwar se — elos se mwe mongo nak ac kof nimuk, unen sheep ac nuknuk linen, oil in olive ac wain.”
6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
Ke ma inge, nga ac kalsalak ke kokul, ac etoak sie pot in kosralla.
7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
El ac kasrusr ukwe mukul el orek pwar nu se tuh el ac fah tia sonolos. El ac fah sokolos tuh el ac fah tia konalosyak. Na el ac fah fahk, “Nga ac folokla nu yurin mukul tumuk ah. Wo nu sik ke pacl se nga muta yorol ah liki na inge.”
8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.
El ac fah tiana akkalemye lah nga pa kital wheat, wain, oil in olive, ac silver ac gold nukewa ma el alyalukin nu sel Baal.
9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
Ouinge ke pacl in kosrani nga fah folokonma mwe sang luk nu sel ke wheat ac wain, ac nga fah eisla unen sheep ac nuknuk linen ma nga tuh sang elan nukum.
10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
Nga fah akkoflufolyal ye mutun mwet el orek pwar yoro, ac wangin sie fah ku in molella liki ku luk.
11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
Nga fah oru tuh pacl in engan lal nukewa in wanginla — pwar lal ke yac nukewa, malem nukewa, Sabbath nukewa — aok, toeni in alyalu nukewa lal.
12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, anụ ọhịa ga-eripịa ha.
Nga fah kunausla ima in grape lal ac sak fig sunal su el fahk mu mukul kawuk lal sang lal. Nga fah ekulla ima in grape lal ac sak sunal tuh in oana yen mwesis. Kosro lemnak uh ac fah kunausla.
13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Nga fah kael ke pacl el tuh mulkinyula ac esukak mwe keng nu sel Baal, ac pacl el naweyukla som ukwe mukul kawuk lal. Pa inge ma LEUM GOD El fahk.
14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
Ouinge nga fah sifil folokunulla nu yen mwesis, ac nga fah kaskas kulang nu sel in akwoye insial.
15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
Nga fah folokonang nu sel ima in grape lal meet ah, ac oru tuh Infahlfal in Lokoalok in ekla mutunoa lun finsrak. El fah topukyu we oana el tuh topukyu ke el fusr ac ilme liki facl Egypt.
16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
Na el fah sifilpa pangon mu nga mukul tumal — el ac fah tia sifilpa pangon mu nga Baal lal.
17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
Nga fah tiana fuhlela elan sifilpa fahkla ine se inge “Baal.”
18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
Ke pacl sac, nga fah oru sie wulela yurin kosro lemnak nukewa ac won sohksok uh, elos in tia akkolukye mwet luk. Nga fah oayapa eosla kufwen mwet mweun nukewa liki acn uh — cutlass ac mwe pisr nukewa — ac nga fah oru tuh mwet luk uh in muta in misla ac tia sensen.
19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
Israel, nga fah eis kom in mutan kiuk nwe tok; Nga ac fah pwayena ac suwosna nu sum; Nga fah akkalemye pakoten ac lungse kawil luk nu sum.
20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
Nga fah karinganang wulela luk nu sum, Ac kom fah akilen lah pwaye nga pa LEUM GOD.
21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
In pacl sac nga fah topuk pre lun Israel, mwet luk.
22 Ala ga-azaghachi ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
Nga fah oru af in kahk nu faclu, Na faclu fah fokkakin wheat, grape ac olive.
23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ. Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’ M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’ Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’”
Nga fah oaki mwet luk fin acn uh, ac oru tuh elos in sun wo ouiya. Nga fah pakoten nu selos su ekin “Tia Pakomuteyuk,” Ac nu selos su ekin “Tia Mwet Luk,” Nga fah fahk, “Kowos mwet luk,” Ac elos fah topuk, “Kom God lasr.”