< Hosiya 14 >

1 Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
Return, O Israel, unto the LORD thy God; for thou hast stumbled in thine iniquity.
2 Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
Take with you words, and return unto the LORD; say unto Him: 'Forgive all iniquity, and accept that which is good; so will we render for bullocks the offering of our lips.
3 Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
Asshur shall not save us; we will not ride upon horses; neither will we call any more the work of our hands our gods; for in Thee the fatherless findeth mercy.'
4 “Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
I will heal their backsliding, I will love them freely; for Mine anger is turned away from him.
5 Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
I will be as the dew unto Israel; he shall blossom as the lily, and cast forth his roots as Lebanon.
6 ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.
His branches shall spread, and his beauty shall be as the olive-tree, and his fragrance as Lebanon.
7 Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
They that dwell under his shadow shall again make corn to grow, and shall blossom as the vine; the scent thereof shall be as the wine of Lebanon.
8 Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
Ephraim shall say: 'What have I to do any more with idols?' As for Me, I respond and look on him; I am like a leafy cypress-tree; from Me is thy fruit found.
9 Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Whoso is wise, let him understand these things, whoso is prudent, let him know them. For the ways of the LORD are right, and the just do walk in them; but transgressors do stumble therein.

< Hosiya 14 >