< Hosiya 13 >

1 Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
While Ephraim was speaking, a horror entered Israel, and he offended by Baal, and he died.
2 Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”
And now they add that they will be sinning more. And they have made themselves an image cast from their silver, just like the image of idols; but the whole thing has been made by craftsmen. These say to them, “Sacrifice men, you who adore calves.”
3 Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
For this reason, they will be like the morning clouds, and like the morning dew that passes away, just like the dust that is driven by a whirlwind away from the threshing floor, and like the smoke from a chimney.
4 “Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
But I am the Lord your God from the land of Egypt, and you will not know God apart from me, and there is no Savior except me.
5 Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
I knew you in the desert, in the land of solitude.
6 Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.
According to their pastures, they have been filled up and have been satisfied. And they have lifted up their heart, and they have forgotten me.
7 Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
And I will be to them like a lioness, like a leopard in the way of the Assyrians.
8 Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.
I will run to meet them like a bear that has been robbed of her young, and I will split open the middle of their liver. And I will devour them there like a lion; the beast of the field will tear them apart.
9 “Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?
Perdition is yours, Israel. Your help is only in me.
10 Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
Where is your king? Now, especially, let him save you in all your cities, and from your judges, about whom you said, “Give me kings and princes.”
11 Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
I will give you a king in my wrath, and I will take him away in my indignation.
12 Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
The iniquity of Ephraim has been bound; his sin has been engulfed.
13 Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
The pains of giving birth will reach him. He is an unwise son. For now he will not remain firm during the contrition of his sons.
14 “Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, (Sheol h7585)
I will free them from the hand of death; from death I will redeem them. Death, I will be your death. Hell, I will be your deadly wound. Consolation is hidden from my eyes. (Sheol h7585)
15 ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.
For he will make a division among brothers. The Lord will bring a burning wind, rising up from the desert, and it will dry up his streams, and it will make his fountain desolate, and he will tear apart every collection of desirable useful things.
16 Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Let Samaria perish, because she has urged her God towards bitterness. Let them perish by the sword, let their little ones be thrown down, and let their pregnant women be cut in two.

< Hosiya 13 >