< Hosiya 12 >

1 Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.
Ephraim feeds on wind, and follows after the east wind: he daily increases lies and desolation; and they do make a covenant with the Assyrians, and oil is carried into Egypt.
2 Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.
The LORD has also a controversy with Judah, and will punish Jacob according to his ways; according to his doings will he recompense him.
3 Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.
He took his brother by the heel in the womb, and by his strength he had power with God:
4 E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,
Yes, he had power over the angel, and prevailed: he wept, and made supplication to him: he found him in Bethel, and there he spoke with us;
5 Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, Onyenwe anyị bụ aha ya.
Even the LORD God of hosts; the LORD is his memorial.
6 Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.
Therefore turn you to your God: keep mercy and judgment and wait on your God continually.
7 Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa, ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.
He is a merchant, the balances of deceit are in his hand: he loves to oppress.
8 Ifrem kwuru, “Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu! Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu, ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.”
And Ephraim said, Yet I am become rich, I have found me out substance: in all my labors they shall find none iniquity in me that were sin.
9 “Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, onye si nʼIjipt kpọpụta unu. Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.
And I that am the LORD your God from the land of Egypt will yet make you to dwell in tabernacles, as in the days of the solemn feast.
10 A gwara m ndị amụma, ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”
I have also spoken by the prophets, and I have multiplied visions, and used similitudes, by the ministry of the prophets.
11 Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ.
Is there iniquity in Gilead? surely they are vanity: they sacrifice bullocks in Gilgal; yes, their altars are as heaps in the furrows of the fields.
12 Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
And Jacob fled into the country of Syria, and Israel served for a wife, and for a wife he kept sheep.
13 Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.
And by a prophet the LORD brought Israel out of Egypt, and by a prophet was he preserved.
14 Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.
Ephraim provoked him to anger most bitterly: therefore shall he leave his blood on him, and his reproach shall his LORD return to him.

< Hosiya 12 >