< Hosiya 10 >

1 Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
Israeli ni mzabibu mzuri ambao huzaa matunda yake. kwa kadiri matunda yake yanavyoongezeka vivyo hivyo anajenga madhabahu nyingi. Kwa kuwa nchi yake ilizalishwa zaidi, aliboresha nguzo zake.
2 Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
Moyo wao ni udanganyifu; sasa wanapaswa kubeba hatia yao. Bwana ataharibu madhabahu zao; ataharibu nguzo zao.
3 Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
Kwa maana watasema, “Hatuna mfalme, kwa maana hatukumcha Bwana. Na mfalme-angeweza kutufanyia nini?”
4 Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
Wanasema maneno tupu na kufanya maagano kwa kuapa uongo. Kwa hivyo haki inakuja kama magugu yenye sumu katika mito ya shamba.
5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.
Wakazi wa Samaria wataogopa kwa sababu ya ndama za Beth Aveni. Watu wake waliomboleza juu yao, kama walivyofanya wale makuhani wa sanamu ambao walikuwa wamefurahi juu yao na utukufu wao, lakini hawako tena.
6 Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
Wao watachukuliwa kwenda Ashuru kama sadaka kwa mfalme mkuu. Efraimu atakuwa na aibu, na Israeli atakuwa na aibu kwa sanamu yake.
7 A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
Mfalme wa Samaria ataangamizwa, kama chipu cha kuni juu ya uso wa maji.
8 a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven, ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”
Sehemu za juu za uovu zitaharibiwa. Hii ndiyo dhambi ya Israeli! Miti na vichaka vitakua juu ya madhabahu zao. Watu wataiambia milima, “Tufunike sisi!” na kwa vilima, “Tuangukieni!”
9 “Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
Ee Israeli, umetenda dhambi tangu siku za Gibea; huko umebaki. Je, vita vitawapata wana wa uovu huko Gibea?
10 Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
Nitakapotaka, nitawaadhibu. Mataifa wataungana pamoja nao na kuwaweka katika vifungo kwa uovu wao mara mbili.
11 Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
Efraimu ni ndama mwenye mafunzo ambayo anapenda kupura nafaka, hivyo nitaweka jozi juu ya shingo yake nzuri. Efraimu nitauweka jozi; Yuda ataimea; Yakobo atauvuta pigo kwa nafsi yake.
12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
Jifanyieni haki, vuneni matunda ya uaminifu wa agano. Chimbueni ardhi yenu isiyopandwa, kwa maana ni wakati wa kumtafuta Bwana, mpaka atakapokuja na kuinua haki juu yenu.
13 Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
Mmelima uovu; mmevuna udhalimu. Mmekula matunda ya udanganyifu kwa sababu uliamini katika mipango yako na katika askari wako wengi.
14 Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu, ebe unu niile e wusiri ike ga-ada. Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha, mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
Kwa hiyo mlipuko wa vita utafufuka kati ya watu wako, na miji yako yote yenye ngome itaharibiwa. Itakuwa kama Shalmani aliharibu Beth Arbeli siku ya vita, wakati mama alivunjika vipande vipande na watoto wake.
15 Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel, nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu. Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
Kwa hiyo itakuwa kwako, Betheli, kwa sababu ya uovu wako mkubwa. Wakati wa mchana mfalme wa Israeli atakatwa kabisa.

< Hosiya 10 >