< Hosiya 10 >

1 Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
Israel is an empty vine, he brings forth fruit to himself: according to the multitude of his fruit he has increased the altars; according to the goodness of his land they have made goodly images.
2 Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
Their heart is divided; now shall they be found faulty: he shall break down their altars, he shall spoil their images.
3 Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
For now they shall say, We have no king, because we feared not the LORD; what then should a king do to us?
4 Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
They have spoken words, swearing falsely in making a covenant: thus judgment springs up as hemlock in the furrows of the field.
5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.
The inhabitants of Samaria shall fear because of the calves of Bethaven: for the people thereof shall mourn over it, and the priests thereof that rejoiced on it, for the glory thereof, because it is departed from it.
6 Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
It shall be also carried to Assyria for a present to king Jareb: Ephraim shall receive shame, and Israel shall be ashamed of his own counsel.
7 A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
As for Samaria, her king is cut off as the foam on the water.
8 a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven, ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”
The high places also of Aven, the sin of Israel, shall be destroyed: the thorn and the thistle shall come up on their altars; and they shall say to the mountains, Cover us; and to the hills, Fall on us.
9 “Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
O Israel, you have sinned from the days of Gibeah: there they stood: the battle in Gibeah against the children of iniquity did not overtake them.
10 Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
It is in my desire that I should chastise them; and the people shall be gathered against them, when they shall bind themselves in their two furrows.
11 Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
And Ephraim is as an heifer that is taught, and loves to tread out the corn; but I passed over on her fair neck: I will make Ephraim to ride; Judah shall plow, and Jacob shall break his clods.
12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
Sow to yourselves in righteousness, reap in mercy; break up your fallow ground: for it is time to seek the LORD, till he come and rain righteousness on you.
13 Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
You have plowed wickedness, you have reaped iniquity; you have eaten the fruit of lies: because you did trust in your way, in the multitude of your mighty men.
14 Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu, ebe unu niile e wusiri ike ga-ada. Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha, mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
Therefore shall a tumult arise among your people, and all your fortresses shall be spoiled, as Shalman spoiled Betharbel in the day of battle: the mother was dashed in pieces on her children.
15 Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel, nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu. Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
So shall Bethel do to you because of your great wickedness: in a morning shall the king of Israel utterly be cut off.

< Hosiya 10 >