< Ndị Hibru 9 >

1 Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo.
O ŋantaadi kpelo moko den pia o ñoabona ya n tuugi leni i jandi leni u kaangagidi ŋamu yu n den ye ki tingi po.
2 E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ.
Lane n teni ke bi caani li gbandieli, u cicili kaanu naan kani ke bi yi u kangagidiŋamu. lan kani n pia ki fidisanga tiankaanu, tabili, leni ban bili ya dipen
3 Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ,
Bu kpalipigni ka liebu liiga pia ban yi naani ukangagiŋamu moanu.
4 nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ.
Lie nni den pia wula padibinbinli ban yen ju tulale naani ki go pia ku ŋantaadi kpaagu yaagu ke wula taabigu ku kaani kuli. wula tadiga mana n den kpie naani den ye ku ŋantaadikpaagu yeni niini, leni Alono gbianu yu gbianu yu n den bundi, leni o ŋantaado n diani yaa tana po.
5 Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.
Ku ŋantaadikpagu yeni tampoli den pia yaa Malekinke bi yiba Selubaaba nan nana yaalin waani ke U tienu kpiagidi ye li kani, ke bi fiabi den wagini ku ŋantaadikpagu yeni bulŋoaluodi kaanu. laa tie moala n ka ke ti baa togidi yi li kuli.
6 Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.
Nani li kuli n den bili maama, bi kopadicianba yaaba n tuuni li kopadiciantuonli, bi yen kua o yogunu kuli li gbandieli nni kaankpialu.
7 Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
Liigi po u kanlielu li gbandieli nni o kopadicianbado bebe n den bili nni ta yenma, o kan kua kaa kubi ya soama ke o baa padi wani o yaaba yaa tuonbiadi po, leni bi niba kuli tuonbiadi po.
8 Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo.
Lan kuli U tienu Fuoma yua den bua ki doagidi ki waani ke yaa sanu n baa teni tin kua u kangagidi ŋanmoanu daa luodi hali li yaa tie ke li gbandieli da baa ye.
9 Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.
Lan kuli den tie moala nne yaa nannanli, yaali n bundi ke ban cuani yaa paabu leni yaa paada kan fidi ki teni yua n tiendi lani n dagidi cain ke o pali nni siedo n yaa dua.
10 Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.
Mi jiema, li bonñokaala leni mi candiŋanma buoli kuli, laa ñoabona kuli den tie o nisaalo n baa tiendi yaala hali milebidima yogunu n bati cua.
11 Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,
Ama kilisiti wan den cua ki tie kopadicianbado yaa bonŋanla n kpendi yaa po. O den kua ya gbandieli ya niini n yaba ki go ŋani ki cie, o nisaalo n kaa maa yaali. lani n bundi ke laa tie ya tagima n tiene yaa bonla. O den kua u kaangagidi ŋanmoanu nni yenma ke li dagidi i yoguni kuli po.
12 o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. (aiōnios g166)
waa den kua leni a pudibuana leni a naabila yaa soama ka, ama leni wani O yaa soacele ki den daa ki faabiti o yogunu kuli po. (aiōnios g166)
13 Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ.
Kelima a budibuana leni a naatona yaa soama, leni o naañoa fantanpienma yaa den ba fidi ki ŋuudi ki ñani ban mii yaaba yaapo bi joagindi ki teni bi gbanandi n yaa ŋani,
14 Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ. (aiōnios g166)
Kilisiti yaa soama n baa ŋuudi ki cie, wan yua, leni U tienu fuoma yua yua n ye o yogunu teni ke o den puni o yuli cain U tienu nani yaa padili n kaa pia joagindi ba kuli baa ŋuudi ti pala siedo leni a tuonkpiema ke yin fidi ki soani U tienu yua n fo yaa po. (aiōnios g166)
15 Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ. (aiōnios g166)
Lan yaa po n teni ke O tie o ŋantaadi paano yaa candanbaalo. nani wan den kpe ki daa bi niba leni yaa tuonbiadi ke bi den tieni o ŋantaadikpelo yaa yogunu. lan tie U tienu n yini yaaba kuli baa ba wan den nianba yaa faali n ki pia gbenma yeni. (aiōnios g166)
16 Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla.
Kelima li ñoabonjuodi kaali n ŋa naani, li tie tiladi ke yua n ŋa laa ñoabonli ban sua ke waa go baa ye. Ban ŋa ya ñoabonjuodi kaali pia mi fuoma li daano yaa ti ye.
17 Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ.
kelima lii pia gbamanu ba kuli, hali yua n ŋa laa ñoabonlijuodi kaali yaa baa ki ye.
18 Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya.
lan yaa po yo ke, ba o ŋantaadi kpialo den tieni leni mi soama.
19 Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile.
Musa, n den waani Isalelee yaaba U tienu balimaama kuli ki gbeni yaa yogunu, o den ta a naatonbila leni a pudibuana yaa soama ki kali taani leni mi ñima, ki go ta i gaalimoani leni Isopi tiidi benu, o den tuu mi soama yeni niini ki mii wan den cogi yaa tili yeni po, leni bi niba kuli po ki yedi:
20 Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.”
Li ne n tie o ŋantaado yaa soama, Utienu n bili yi po yua.
21 Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.
O go den tu mi soama yeni ki mii li gbandieli po leni lin n pia yaa tuonsoantiadi kuli i jaandi po.
22 Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.
Nani li balimaama n yedi maama li bonli kuli den ŋuudi leni mi soama. kelima mi soama yaa wuli sugili ki ye.
23 O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.
Li den tie tiladi kelima yaa bonli n tie tanpoli yala yaa nannana moko den baa ŋuudi yene leni mi soama lan wani ke tanpoli yaa bonmoanla, leni a pada, n yaa ŋani ki cie yaali n yene.
24 Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.
Kelima Kilisiti naa den kua o nisaalo n tagi yaa kaangagidi ŋamu yu naani nni u bonmoanu ya niini ka, ama o den kua tanpoli moala ki ye U tienu kani miadi O ti po.
25 Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.
Waa den kua tanpoli ki go baa puuni o yuli nani li padili yeni yogunu n kuli ka, nani o kopadicianbado n yen kua binli kuli maama u kaangagidi ŋanmoanu leni mi soama yeni.
26 Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. (aiōn g165)
Li yaa tie yen ka, li den baa tua tiladi wan cili ki laadi fala yogunu boncianla hali ŋanduna cili yogunu; ki sua moala mi juodima yogunu, O cua ki puni O yuli yenma nani li padili yeni o yogunu kuli po, ki bolini ti tuonbiadi. (aiōn g165)
27 Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,
Nani lan bili nisaali kuli po maama, ke o baa kpe yenma, li puoli U tienu n jia o buudi.
28 otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.
Li tie yene ke Kilisiti yua n den puni o yuli yenma ki den tugi niba boncianla tuonbiadi. O go baa guani mi liema ki doagidi O yuli ke li kan yaa tie ti tuonbiadi ñanma po ka, ama yaaba n gu O cuama yaa tindima po.

< Ndị Hibru 9 >