< Ndị Hibru 7 >
1 Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.
原來這默基瑟德是撒冷王,是至高者天主的司祭;當亞巴郎打敗眾王回來時,他來迎接,且祝福了他。
2 Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”
亞巴郎就由所有的一切之中,拿出十分之一分給了他;他的名字默基瑟德,第一可稱作「正義之王,」他也可稱作「撒冷之王」,就是「和平之王」之意。
3 O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.
他無父,無母,無族譜,生無始,壽無終:他好像天主子,永久身為司祭。
4 Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha!
你們要想想:這人是多麼偉大,連聖祖亞巴郎也由上的戰利品中,取了十分之一獻給了他,
5 Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham.
那些由肋未子孫中領受司職的,固然有命向人民,按法律徵收什一之物,既向他們的弟兄,雖然都是出自亞巴郎的腰中,
6 Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.
可是不屬於他們世系的那一位,卻收了亞巴郎的什一之物,並祝福了那蒙受恩許的。
7 O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta.
從來,在下的受在上的祝福,這是無人可反對的。
8 Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ.
在這裏那些領受什一之物的,是有死的人;但是那裏領受什一之物的,卻是一位證明了常活著的人。
9 Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.
並且可說:連那領受什一之物的肋未,也藉著亞巴郎,交納了什一之物,
10 Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.
因為當默基瑟德迎接亞巴郎的時候,肋未還在祖先的腰中。
11 Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?
那時,如果藉著肋未司祭職能有成全──因為選民就是本著這司祭職接受了法律──為什麼還須要興起另一位,按照默基瑟德品位的司祭,而不稱為亞郎的品位呢﹖
12 Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu.
如今司祭職一變更,法律也必然變更,
13 Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.
因為這裏所論到的那一位,原是屬於另一支派,由這一支派中,沒有一個人曾在祭壇服務過。
14 Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.
顯然我們的主是由猶太支派出生的,關於這一支派,梅瑟從未提到司祭的事。
15 E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
既然有另一位司祭,是按照默基瑟德的品級興起的,那我們所討論的就更顯明了,
16 Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.
因為衪之成為司祭,並不是按照血統所規定的法則,而是按照不可消滅的生命的德能,
17 Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” (aiōn )
因為有聖經給它作證:『你照默基瑟德的品位永做司祭。』 (aiōn )
18 Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya
先前的誡命之廢除,是由於它的弱點和無用,
19 (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.
因為法律本來就不能成就什麼;可是如今引進了一個更好的希望,因著這希望,我們纔能親近天主。
20 Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja.
再者,耶穌成為司祭是具有天主誓言其他的司祭並沒有這種誓言就成了司祭。
21 Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’” (aiōn )
耶穌成為司祭,卻具有誓言,因為天主向他說:『上主一發了誓,他決不再反悔;你永為司祭。』 (aiōn )
22 Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.
如此,耶穌就成了更好的盟約的擔保人。
23 Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha.
再者,肋未人成為司祭的,人數眾多,因為死亡阻礙他們長久留任,
24 Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. (aiōn )
但是耶穌因永遠長存,具有不可消逝的司祭品位。 (aiōn )
25 Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.
因此,凡由他而接近天主的人,他全能拯救,因為他常活著,為他們轉求。
26 Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.
這樣的大司祭纔適合於我們,他是聖善的、無辜的、無玷的、別於罪人的、高於諸天的;
27 Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja.
無須像那些大司祭一樣,每日要先為自己的罪,後為人民的罪,祭獻犧牲;因為衪奉獻了自己,只一次而為永遠完成了這事,
28 Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn )
因為法律所立為大司祭的人是有弱點的;可是在法律以後,以誓言所立的聖子,卻是成全的,直到永遠。 (aiōn )