< Ndị Hibru 6 >
1 Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
Naizvozvo, tichisiya zvekutanga zvedzidziso yaKristu, ngatipfuurire mukupedzeredza, tisingaisizve nheyo yekutendeuka kubva pamabasa akafa, neyekutenda kuna Mwari,
2 na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. (aiōnios )
yedzidziso yebhabhatidzo, neyekuisa maoko, neyekumuka kwevakafa, neyekutonga kwekusingaperi. (aiōnios )
3 Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.
Uye izvi tichaita, kwega kana Mwari achitendera.
4 Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ,
Nokuti hazvigoneki kuti vakambovhenekerwa, vakaravira chipo chekudenga, ndokuva vagovani veMweya Mutsvene,
5 ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, (aiōn )
vakaravira shoko rakanaka raMwari, nemasimba enyika inouya, (aiōn )
6 ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.
ndokutsauka kutivavavandudzirezve mukutendeuka, zvavanozvirovererazve pamuchinjikwa Mwanakomana waMwari, vachimunyadzisa pachena.
7 Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
Nokuti nyika inonwa mvura inogarouya pamusoro payo, ndokubereka miriwo yakafanira avo vanoirimawo, inowana ropafadzo kubva kuna Mwari;
8 Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.
asi iyo inobereka minzwa nerukato, inorambwa uye yava pedo nekutukwa; kuguma kwayo kuri mukupiswa.
9 Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa.
Asi tine chokwadi pamusoro penyu chezvinhu zviri nani, vadiwa, uye zvinhu zvine ruponeso, kunyange tichitaura sezvizvi;
10 Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.
nokuti Mwari haasi asakarurama kuti akanganwe basa renyu nebasa rakarema rerudo rwamakaratidza kuzita rake, pamakashumira vatsvene uye muchiri kushumira.
11 Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru.
Zvino tinoshuva kuti umwe neumwe wenyu aratidze kushingaira kwakadaro kuve kuvimbiswa kwakakwana kwetariro pakuguma.
12 Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.
Kuti murege kuva simbe, asi vateveri veavo vanodya nhaka yezvivimbiso kubudikidza nerutendo nemoyo murefu.
13 Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
Nokuti Mwari paakavimbisa Abhurahama, nokuti wakange asina wakamudarika waangapika naye, wakapika naiye pachake,
14 na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
achiti: Zvirokwazvo kuropafadza ndichakuropafadza, nekuwanza ndichakuwanza.
15 Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
Saizvozvowo, wakati atsungirira nemoyo murefu akawana chivimbiso.
16 Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
Nokuti vanhu zvirokwazvo vanopika nemukuru kwavari, nemhiko yekusimbisa kuguma kwegakava rese kwavari.
17 Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.
Pakazoti Mwari achida zvikurusa kuratidza kuvadyi venhaka yechivimbiso kusashanduka kwezano rake, wakamiririra nemhiko,
18 Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị.
kuti nezvinhu zviviri zvisingashanduki, pazviri pasingagoni kuti Mwari areve nhema, tive nekunyaradzwa kwakasimba, iyesu takatizira kunovanda kuti tibatirire kutariro yakaiswa pamberi pedu;
19 Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi
yatinayo sechitsigiso chemweya chakatsiga uye chakasimba, inopinda kune zviri mukati mevheiri;
20 ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. (aiōn )
apo nhungamiri payakatipindira, iye Jesu, wakaitwa mupristi mukuru nekusingaperi, kubva kurudzi rwaMerikizedheki. (aiōn )