< Ndị Hibru 4 >
1 Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.
Therefore, we should be afraid, lest the promise of entering into his rest may be relinquished, and some of you may be judged to be lacking.
2 Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
For this was announced to us in a similar manner as to them. But the mere hearing of the word did not benefit them, since it was not joined together with a faith in those things that they heard.
3 Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.
For we who have believed shall enter into rest, in the same manner as he said: “So it is as I have sworn in my wrath: They shall not enter into my rest!” And certainly, this is when the works from the foundation of the world have been finished.
4 Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”
For, in a certain place, he spoke about the seventh day in this manner: “And God rested on the seventh day from all his works.”
5 Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”
And in this place again: “They shall not enter into my rest!”
6 Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.
Therefore, this is because certain ones remain who are to enter into it, and those to whom it was announced first did not enter into it, because of unbelief.
7 O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.”
Again, he defines a certain day, after so much time, saying in David, “Today,” just as it was stated above, “If today you hear his voice, harden not your hearts.”
8 Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.
For if Jesus had offered them rest, he would never have spoken, afterward, about another day.
9 Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.
And so, there remains a Sabbath of rest for the people of God.
10 Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.
For whoever has entered into his rest, the same has also rested from his works, just as God did from his.
11 Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.
Therefore, let us hasten to enter into that rest, so that no one may fall into the same example of unbelief.
12 Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
For the Word of God is living and effective: more piercing than any two-edged sword, reaching to the division even between the soul and the spirit, even between the joints and the marrow, and so it discerns the thoughts and intentions of the heart.
13 Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
And there is no created thing that is invisible to his sight. For all things are naked and open to the eyes of him, about whom we are speaking.
14 Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.
Therefore, since we have a great High Priest, who has pierced the heavens, Jesus the Son of God, we should hold to our confession.
15 Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.
For we do not have a high priest who is unable to have compassion on our infirmities, but rather one who was tempted in all things, just as we are, yet without sin.
16 Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.
Therefore, let us go forth with confidence toward the throne of grace, so that we may obtain mercy, and find grace, in a helpful time.