< Ndị Hibru 3 >
1 Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
Naizvozvo, hama tsvene, vagovani vekudanwa kwekudenga, rangarirai muapositori nemupristi mukuru wekupupura kwedu, iye Kristu Jesu,
2 O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke.
wakatendeka kuna iye wakamugadza, saMozisiwo muimba yake yese.
3 Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
Nokuti uyu wakanzi wakafanira rukudzo kupfuura Mozisi, sezvo anovaka imba ane rukudzo kuipfuura.
4 Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
Nokuti imba imwe neimwe inovakwa neumwe; asi anovaka zvese ndiMwari.
5 Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.
Zvino Mozisi zvirokwazvo wakanga akatendeka muimba yake yese semuranda, kuti huve uchapupu hwezvinhu zvaizotaurwa;
6 Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
asi Kristu seMwanakomana pamusoro peimba yake; imba yake yatiri isu, kana chete tikabatisisa kushinga nekuzvirumbidza kwetariro kusvika pakuguma.
7 Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
Naizvozvo sezvinotaura Mweya Mutsvene achiti: Nhasi kana muchinzwa inzwi rake,
8 unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
musaomesa moyo yenyu, sepakumukira, nezuva rekuedzwa murenje,
9 ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
madzibaba enyu paakandiedza, vachindinzvera, ndokuona mabasa angu makore makumi mana.
10 Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
Naizvozvo ndakatsamwiswa nezera iro, ndokuti: Vanogara vachitsauka pamoyo; uye ava havana kuziva nzira dzangu;
11 Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”
naizvozvo ndakapika pakutsamwa kwangu, ndikati: Havangatongopindi pazororo rangu.
12 Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.
Chenjererai, hama, kuti kusava nemoyo wakashata wekusatenda pakati peumwe neumwe wenyu, pakutsauka kubva kuna Mwari mupenyu;
13 Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.
asi kurudziranai pazuva nezuva, kuchanzi nhasi; kuti kurege kuva neumwe wenyu anoomeswa nekunyengera kwechivi;
14 Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
nokuti tava vagovani vaKristu, kana chete tichibatisisa kuvamba kwechivimbo kusvikira pakuguma;
15 Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
kuchanzi: Nhasi kana muchinzwa inzwi rake, musaomesa moyo yenyu, sepakumukira.
16 Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?
Nokuti vamwe vakati vanzwa vakamukira, asi havasi vese vakabva Egipita kubudikidza naMozisi.
17 Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
Asi wakatsamwiswa nani makore makumi mana? Havasi ivo vakatadza here, vane mitumbi yakawira murenje?
18 Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi?
Uye ndivana ani vaakapikira kuti havangapindi pazororo rake, kunze kweavo vasina kutenda?
19 Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
Zvino tinoona kuti vakange vasingagoni kupinda nekuda kwekusatenda.