< Ndị Hibru 2 >

1 Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
Nekuda kweizvozvi tinofanira kuchenjerera zvikuru kuzvinhu zvatakanzwa, zvimwe tingakukurwa.
2 Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
Nokuti kana shoko rakataurwa nevatumwa rakange rakasimba, uye kudarika kwese nekusateerera kwakagamuchira kutsiva kwakarurama,
3 Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
isu tichapukunyuka sei kana tisina hanya neruponeso rukuru rwakadai? Irwo pakutanga rwakataurwa naIshe, rukasimbiswa kwatiri naivo vakanzwa,
4 Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.
Mwari achivapupurirawo zvese nezviratidzo nezvishamiso, nemasimba akasiyana-siyana, nezvipo zveMweya Mutsvene, zvichienderana nechido chake.
5 Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
Nokuti haana kuisa nyika inouya pasi pevatumwa, yatinotaura nezvayo.
6 Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
Asi umwe pane imwe nzvimbo wakapupura achiti: Munhu chii, kuti mumurangarire? kana mwanakomana wemunhu, kuti muve nehanya naye?
7 Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
Makamuderedza zvishoma kuvatumwa; makamushongedza korona nekubwinya nerukudzo, ndokumumisa pamusoro pemabasa emaoko enyu.
8 dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
Zvinhu zvese makaisa pasi petsoka dzake. Nokuti pane izvozvi wakaisa zvese pasi pake, haana kusiya chinhu chisina kuiswa pasi pake. Asi ikozvino tigere kuona zvinhu zvese zvakaiswa pasi pake.
9 Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
Asi tinoona Jesu, akaderedzwa zvishoma kuvatumwa, nekuda kwedambudziko rerufu, akashongedzwa korona nekubwinya nerukudzo, kuti iye nenyasha dzaMwari aravire rufu achiitira wese.
10 Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
Nokuti zvakange zvakamufanira, iye zvinhu zvese zviripo nekuda kwake, uye kubudikidza naye zvese zviripo, pakuisa vanakomana vazhinji mukubwinya, apedzeredze mutungamiriri weruponeso rwavo kubudikidza nematambudziko.
11 Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
Nokuti neanovaitisa vatsvene naivo vanoitwa vatsvene vese vakabva kune umwe; nemhaka iyi haanyadziswi kuvaidza hama,
12 Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
achiti: Ndichaparidzira zita renyu kuhama dzangu, pakati pekereke ndichakuimbirai rumbidzo.
13 Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”
Uyezve: Ini ndichavimba naye. Uyezve: Tarirai ini nevana Mwari vaakandipa.
14 Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.
Naizvozvo sezvo vana vari vagovani venyama neropa, naiye pachake wakagovana navo izvozvi; kuti kubudikidza nerufu iye aparadze uyo ane simba rerufu, iye dhiabhorosi,
15 Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
agosunungura avo vese kubudikidza nekutya rufu vaiva pasi peuranda upenyu hwese.
16 Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
Nokuti zvirokwazvo haazvitoreri vatumwa, asi wakazvitorera mbeu yaAbhurahama.
17 Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
Naizvozvo wakafanira pazvinhu zvese kufananidzwa nehama dzake, kuti ave mupristi mukuru ane tsitsi nekutendeka pazvinhu zvaMwari, kuti aite muripo wezvivi zvevanhu.
18 Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
Nokuti pane izvozvo iye amene wakatambudzika achiedzwa, anogona kubatsira vanoedzwa.

< Ndị Hibru 2 >