< Ndị Hibru 2 >
1 Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
Wherefore wee ought diligently to giue heede to the thinges which wee haue heard, lest at any time we runne out.
2 Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
For if the worde spoken by Angels was stedfast, and euery transgression, and disobedience receiued a iust recompence of reward,
3 Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
How shall we escape, if we neglect so great saluation, which at the first began to be preached by the Lord, and afterward was confirmed vnto vs by them that heard him,
4 Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.
God bearing witnes thereto, both with signes and wonders, and with diuers miracles, and gifts of the holy Ghost, according to his owne will?
5 Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
For he hath not put in subiection vnto the Angels the world to come, whereof we speake.
6 Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
But one in a certaine place witnessed, saying, What is man, that thou shouldest bee mindefull of him? or the sonne of man, that thou wouldest consider him?
7 Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
Thou madest him a litle inferiour to ye Angels: thou crownedst him with glory and honour, and hast set him aboue the workes of thine hands.
8 dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
Thou hast put all things in subiection vnder his feete. And in that he hath put all things in subiection vnder him, he left nothing that should not be subiect vnto him. But we yet see not all things subdued vnto him,
9 Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
But we see Iesus crowned with glory and honour, which was made litle inferiour to the Angels, through the suffering of death, that by Gods grace he might taste death for all men.
10 Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
For it became him, for whome are all these thinges, and by whome are all these things, seeing that hee brought many children vnto glory, that he should consecrate the Prince of their saluation through afflictions.
11 Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
For he that sanctifieth, and they which are sanctified, are all of one: wherefore he is not ashamed to call them brethren,
12 Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
Saying, I will declare thy Name vnto my brethren: in the middes of the Church will I sing praises to thee.
13 Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”
And againe, I will put my trust in him. And againe, Beholde, here am I, and the children which God hath giuen me.
14 Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.
Forasmuch then as the children are partakers of flesh and blood, he also himselfe likewise tooke part with them, that hee might destroye through death, him that had the power of death, that is the deuil,
15 Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
And that he might deliuer all them, which for feare of death were all their life time subiect to bondage.
16 Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
For he in no sort tooke on him the Angels nature, but hee tooke on him the seede of Abraham.
17 Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
Wherefore in all things it behoued him to be made like vnto his brethren, that hee might be mercifull, and a faithfull hie Priest in things concerning God, that he might make reconciliation for the sinnes of the people.
18 Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
For in that he suffered, and was tempted, he is able to succour them that are tempted.