< Ndị Hibru 13 >

1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.
Rudo rweukama ngarugare.
2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
Musakanganwa kugamuchira vaeni; nokuti mukudaro vamwe vakagamuchira vatumwa vasingazvizivi.
3 Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
Rangarirai vasungwa, semakasungwa pamwe navo; vanoitirwa zvakaipa, sezvinonzi ndimwiwo muri pamuviri.
4 Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
Wanano ngaikudzwe kune vese, nenhovo irege kusvibiswa; asi Mwari achatonga mhombwe nezvifeve.
5 Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
Mararamiro enyu ngaave ekusakarira mari; gutsikanai nezvinhu zviripo; nokuti iye wakati: Handingatongokurasi, uye handingatongokusii.
6 Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
Naizvozvo tingashinga tichiti: Ishe mubatsiri wangu, uye handingatyi munhu zvaangandiitira.
7 Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
Rangarirai vanokutungamirirai, vakataura kwamuri shoko raMwari; muchicherekedza kuguma kwemafambiro avo, teverai rutendo rwavo.
8 Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Jesu Kristu wakadaro zuro nanhasi, nekusingaperi. (aiōn g165)
9 Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
Musakukurwa nedzidziso dzakasiyana-siyana uye dzisingazikanwi; nokuti chinhu chakanaka kuti moyo usimbiswe nenyasha, kwete nekudya, kwavasina kubatsirwa nako ivo vakafamba makuri.
10 Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
Tine aritari, pavasina kodzero yekudya pairi ivo vanoshumira tabhenakeri.
11 Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
Nokuti mhuka idzo, dzakaisirwa ropa radzo panzvimbo tsvene nemupristi mukuru nekuda kwechivi, mitumbi yadzo inopiswa kunze kwemusasa.
12 Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
Naizvozvo naJesuwo, kuti aite vanhu vave vatsvene neropa rake pachake wakatambudzika kunze kwesuwo.
13 Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
Naizvozvo ngatibudire kwaari kunze kwemusasa, takatakura kunyadziswa kwake.
14 Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
Nokuti pano hatina guta rinogara, asi tinotsvaka rinouya.
15 Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
Naizvozvo kubudikidza naye ngatirambe tichibaira chibairo chekurumbidza kuna Mwari, ndicho chibereko chemiromo ichibvuma zita rake.
16 Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Asi musakanganwa kuita zvakanaka nekudyidzana; nokuti Mwari anofadzwa nezvibairo zvakadaro.
17 Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.
Teererai vanokutungamirirai, uye muzviise pasi pavo; nokuti ava vanorindira mweya yenyu, sevachazopa rondedzero, kuti vaite izvozvo nemufaro, kwete nekugomera; nokuti izvozvo hazvikubatsiriyi.
18 Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.
Tinyengetererei; nokuti tinovimba kuti tine hana yakanaka, tichida kufamba zvakanaka pazvinhu zvese;
19 Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.
uye ndinokukumbirisisai kuti muite izvozvi, kuti ndikurumidze kudzoserwa kwamuri.
20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios g166)
Zvino Mwari werugare, wakadzosa kubva kuvakafa Mufudzi mukuru wemakwai, neropa resungano yekusingaperi, iye Ishe wedu Jesu, (aiōnios g166)
21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
ngaakupereredzei pabasa rese rakanaka kuti muite chido chake, achiita mukati menyu izvo zvinofadza pamberi pake kubudikidza naJesu Kristu, ngaave nekubwinya kusvikira rinhi narinhi. Ameni. (aiōn g165)
22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.
Asi ndinokukumbirisai, hama, gamuchirai makatsunga shoko rekurudziro, nokutiwo ndakunyorerai nemashoko mashoma.
23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
Zivai kuti Timotio hama yedu wakasunungurwa, kana akakurumidza kusvika, ndinozokuonai ndinaye.
24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
Kwazisai vese vanokutungamirirai, nevatsvene vese. Vanobva Itaria vanokukwazisai.
25 Ka amara dịnyere unu niile.
Nyasha ngadzive nemwi mese. Ameni.

< Ndị Hibru 13 >