< Ndị Hibru 13 >

1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.
Go on loving your brothers in the faith.
2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
Take care to keep open house: because in this way some have had angels as their guests, without being conscious of it.
3 Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
Keep in mind those who are in chains, as if you were chained with them, and those who are in trouble, as being yourselves in the body.
4 Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
Let married life be honoured among all of you and not made unclean; for men untrue in married life will be judged by God.
5 Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
Be free from the love of money and pleased with the things which you have; for he himself has said, I will be with you at all times.
6 Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
So that we say with a good heart, The Lord is my helper; I will have no fear: what is man able to do to me?
7 Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
Keep in mind those who were over you, and who gave you the word of God; seeing the outcome of their way of life, let your faith be like theirs.
8 Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Jesus Christ is the same yesterday and today and for ever. (aiōn g165)
9 Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
Do not be turned away by different strange teachings, because it is good for your hearts to be made strong by grace, and not by meats, which were of no profit to those who took so much trouble over them.
10 Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
We have an altar from which those priests who are servants in the Tent may not take food.
11 Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
For the bodies of the beasts whose blood is taken into the holy place by the high priest as an offering for sin are burned outside the circle of the tents.
12 Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
For this reason Jesus was put to death outside the walls, so that he might make the people holy by his blood.
13 Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
Let us then go out to him outside the circle of the tents, taking his shame on ourselves.
14 Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
For here we have no fixed resting-place, but our search is for the one which is to come.
15 Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
Let us then make offerings of praise to God at all times through him, that is to say, the fruit of lips giving witness to his name.
16 Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
But go on doing good and giving to others, because God is well-pleased with such offerings.
17 Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.
Give ear to those who are rulers over you, and do as they say: for they keep watch over your souls, ready to give an account of them; let them be able to do this with joy and not with grief, because that would be of no profit to you.
18 Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.
Make prayers for us, for we are certain that our hearts are free from the sense of sin, desiring the right way of life in all things.
19 Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.
I make this request more strongly, in the hope of coming back to you more quickly.
20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios g166)
Now may the God of peace, who made that great keeper of his flock, even our Lord Jesus, come back from the dead through the blood of the eternal agreement, (aiōnios g166)
21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Make you full of every good work and ready to do all his desires, working in us whatever is pleasing in his eyes through Jesus Christ; and may the glory be given to him for ever and ever. So be it. (aiōn g165)
22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.
But, brothers, take kindly the words which I have said for your profit; for I have not sent you a long letter.
23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
Our brother Timothy has been let out of prison; and if he comes here in a short time, he and I will come to you together.
24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
Give words of love from me to those who are rulers over you, and to all the saints. Those who are in Italy send you their love.
25 Ka amara dịnyere unu niile.
May grace be with you all.

< Ndị Hibru 13 >